Steeti ise a kachasị gbuo mmadụ na Naịjirịa n'afọ 2025

Ebe foto si, Getty Images
Ihe gbasara nchekwa bụ okwu a kachasị kpụrụ n'ọnụ na Naịjirịa nakwa nke na-enye ndị mmadụ nsogbu.
Nsogbu nchekwa ndị Naịjirịa na-agabiga gụnyere mwakpo ndị na-eyi ọha egwu a kpọrọ 'jihadists' na-eme, ndị ojiegbe maọbụ ndị omekome na-atọrọ ndị mmadụ nakwa nsogbu dị n'etiti ndị na-akọ ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi.
Ụlọọrụ 'Beacon Security and Intelligence Limited' na-ahụ maka inyocha ihe gbasara nchekwa na Naịjirịa nakwa mpaghara Sahel n'Afrịka kwuru na ihe gbasara nsogbu nchekwa beletara n'afọ 2025 karịa nke afọ 2024.
N'ihe ndekọ ha na-ewepụta kwa afọ ọbụla, ha kwuru na ndị e gburu egbu na ndị a tọọrọ belatara karịa nke afọ 2024 dịka ha bipụtara steeti ndị nọ na Naịjirịa kachasị nwee nsogbu nchekwa n'afọ 2025.
Ụlọọrụ a gbakwasịrị ukwu n'ihe abụọ wee mee nnyocha a, nke gụnyere ogbugbu na ntọrọ mmadụ.
Zamfara

Ebe foto si, Zamafara State Govt.
Zamfara Steeti dị na mpaghara ugwu Naịjirịa bụ steeti kachasị nwee nsogbu nchekwa n'ime steeti ise 'Beacon Security' wepụtara n'afọ 2025
Ndekọ si n'aka Beacon Security gosiri na mmadụ puku abụọ, narị anọ na iri itoolu na itoolu (2499) bụ ndị atọọrọ, ebe ndị e gburu egbu ruru mmadụ otu puku, narị ise na iri atọ na anọ (1534).
Onye na-eyi ndụ egwu a ma ama bụ Bello Turji bụ ebe ahụ ka ọ nọ.
Katsịna

Ebe foto si, KTTV
Ozi si n'aka ụlọọrụ nchekwa ekwupụtala Katsịna Steeti ya na Zamfara gbara agbataobi dịka steeti nke abụọ ọnọdụ enweghị nchekwa kachasị yie egwu n'afọ 2025.
Katsịna Steeti bụ otu n'ime steeti kachasị nwee mmetụta ndị ojiegbe na-atọrọ mmadụ maka ego mgbapụta.
E gburu ọnụọgụ mmadụ ruru narị itolu na iri na otu (911) ma tọrọ ihe ruru otu puku, narị anọ na iri isii na asatọ (1468)
Niger

Ebe foto si, Getty Images
Niger Steeti dị na mpaghara Ugwu-Etiti Naịjirịa bụ steeti nke atọ kachasị nwee nsogbu nchekwa.
Ọnụọgụ ndị mmadụ e gburu egbu ruru otu puku na narị anọ (1400) ebe a tọọrọ mmadụ ruru narị asatọ na iri atọ na asatọ (838).
Ọ bụ na steeti a ka a tọrọ ọnụọgụ ụmụakwụkwọ kachasị elu, ihe ruru narị atọ (300) n'ụlọakwụkwọ 'St Mary's' dị n'obodo Papiri.
Borno

Ebe foto si, Others
Borno bụ steeti nke anọ kachasị nwee nsogbu nchekwa. Mmadụ ruru narị isii na iri isii na itolu (669) bụ ndị a tọọrọ ebe e gburu ọnụọgụ mmadụ dị otu puku, narị isii na otu (1601)
Ndị na-eyị ọha egwu 'Boko Haram' nakwa 'ISWAP' bụ ndị na-akpa ike ebe ahụ.
Cheta na ọ bụ na Borno Steeti ka e gburu Ọchịagha ndịagha Naịjirịa bụ MA Uba.
Sokoto

Ebe foto si, Sokoto State Govt.
Sokoto Steeti nke nọdebere Zamfara na Katsịna bụ steeti nke ise kachasị nwee nsogbu nchekwa n'afọ 2025.
Mmadụ narị anọ na iri atọ na atọ (433) bụ ndị e gburu, ebe a tọọrọ mmadụ ruru narị asaa na asaa (707).
Ndị na-enye nsogbu ebe a bụ otu Lakurawa.
Steeti ndị ọzọ gụnyere Kebbi, Kano na Kwara.









