A ga-emepe ụlọakwụkwọ ndị e nwere na Niger Steeti n'ọnwa Jenụwarị -Gọọmenti

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Ndị ọchịchị Naịjirịa ekwuola na ụlọakwụkwọ ndị e nwere na Niger Steeti ga-emepegharị n'ọnwa Jenụwarị, 2026, dịka e mechichara ụlọakwụkwọ oge a tọọrọ ụmụakwụkwọ n'igwe n'ọnwa Nọvemba, 2025.
Site n'ụbọchị 12 Jenụwarị 2026, gọọmenti ga-enye ikike ka e mepee ụlọakwụkwọ ọha na nkeonwe ndị nọ "ebe e nwere ezigbo nchekwa", ka mịnịstrị na-ahụ maka agụmaakwụkwọ na Niger Steeti kwuru.
Mkpebi imepegharị ụlọakwụkwọ na Niger Steeti na-abịa dịka ndị nchekwa nọ na steeti ahụ zutere ma nwee mkparịtaụka.
Cheta na ndị ojiegbe tọọrọ ụmụakwụkwọ na ndị ọrụ karịrị narị abụọ na iri ise n'ụlọakwụkwọ Katọlik bụ St Mary's dị n'obodo Papiri nke Niger Steeti n'ọnwa Nọvemba, 2025.
Akụkọ kwuru na gọọmenti sị na ụmụakwụkwọ ndị ahụ ndị ojiegbe tọọrọ ha na ndị nkụzi ha lọghachiri tupu ụbọchị Ekeresimesi.
O nweghị onye ma etu gọọmenti si gbapụta ụmụaka ahụ.
N'agbanyeghị nke a, a kpọpụtabeghị aha ụlọakwụkwọ ndị ga-emepegharị, mana mịnịstrị na-ahụ maka agụmaakwụkwọ na Niger Steeti ga-ewepụta ya oge na-adịghị anya.
Gọọmenti kwuru na ha ga-etinye atụmatụ nchekwa n'ụlọakwụkwọ ndị e nwere na Niger Steeti iji chekwaa ụmụakwụkwọ.

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị ọrụ gọọmenti sị na a tọhapụla ụmụakwụkwọ otu narị na iri atọ a tọọrọ n'ụlọakwụkwọ St. Marys nke ụka Katọlik nwe na Niger Steeti.
Ndị ojiegbe tọọrọ ụmụakwụkwọ ndị a nakwa ndị ọrụ ụlọakwụkwọ ahụ n'ọnwa gara aga.
Otu onye na-ekwuchitere Onyeisiala bụ Sunday Dare kwuru site n'akara soshal midia X, na dịka ọ dị ugbua: 'o nweghi nwata akwụkwọ maọbụ ndị ọrụ ụlọakwụkwọ ahụ ka fọrọ n'aka ndị ekperime'.
Onye nwe ụlọakwụkwọ ahụ ma bụrụkwa onyeisi otu jikọtara ndị ụka Kraịst na Niger Steeti bụ Bishọp Bulus DauwaYohanna gwara BBC na Gọvanọ Niger steeti gwara na nke ahụ bụ eziokwu.
"Gọvanọ kpọrọ m ugbua ma gwa m na ụmụakwụkwụ ndị nkuzi ha fọrọ n'aka ndị ekperima ahụ enwerela onwe ha. Ọ gwara m ka m bịa kpọrọ ha." ka o kwuru.
Kọmishọna ndị uweojii na Niger Steeti bụ Adamu Abdullahi Elleman gwara BBC na ndị ọrụ nchekwa na-enyocha ahụ ụmụakwụkwọ ahụ na ndị nkuzi, na a ga-enyefe ha n'aka nne na nna na Mọnde.
Mana o doghi anya ma a kwụrụ ụgwọ n'isi ụmụakwụkwọ ndị a na ndị nkuzi ha.
Ndị a tọhapụrụ so n'ime ụmụakwụkwọ narị atọ na atọ na ndị nkuzi iri na abụọ bụ ndị ụlọakwụkwọ St. Mary's nke ụlọụka Katọlik, ndị ekperima tọọrọ n'ebe obibi ha n'ụlọakwụkwọ n'ụbọchị 21 Nọvemba.
Na mbido ọnwa Disemba a, a tọhapụrụ ụmụakwụkwọ iri itoolu na itoolu na otu onye nkuzi, nke mere opekatampe mmadụ otu narị na iri isii na ise ka nọ n'aka ndị ekperima ahụ.
"Amaghị m na m ga-ahụ nwa m ọzọ"
Elizabeth Samuel bụ otu onye nne a tọọrọ nwa ya n'ụlọakwụkwọ St Mary's Catholic School dị na Papiri, Naịja steeti, agwala BBC etu ya na ije si gaa oge o nwetara ozi na nwa ya nwoke so n'ụmụakwụkwọ ahụ ndị ojiegbe tọọrọ.
Ọ kọwaara anyị na ya enweghị ike iri nri maọbụ mee ihe ọbụla ma kwuo na ọṅụ juputara ya obi maka na nwa ya so n'ụmụakwụkwọ 100 ahụ a tọhapụrụ.
Mana Marcus Adoka bụ nwoke a tọọrọ nwa ya nwaanyị aha ya bụ Rita, kwuru na obi adịghị mma ma ncha n'ihi na nwa ya ka nọ n'aka ndị ntọ ahụ.
Mgbe a tọhapụrụ ụmụakwụkwọ 99 na otu onye nkuzi
Onyeisioche otu Christian Association of Nigeria (CAN) ngalaba Niger steeti bụ Bishọpụ Dauwa Yohanna na kọmishọna ndị uweojii Niger steeti bụ Adamu Abdullahi Elleman ekwuola na ndị ọrụ nchekwa azọpụtala ụmụakwụkwọ 100 a tọọrọ n'ụlọakwụkwọ St Mary's Catholic School dị na Papiri, Niger steeti.
Ha kwuru na ọ bụ ụlọọrụ National Security Adviser (NSA) nyere ha ozi a ma kwuo na a ga-amalite inyefe ụmụakwụkwọ n'aka ndị ezinaụlọ ha dị iche iche malite n'ụbọchị Mọnde 8 Disemba, 2025.
Cheta na Nuhu Ribadu bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ, gara njem nleta na Papiri n'izuụka gara aga ebe ọ nọrọ kwe nkwa na a ga-azọpụta ụmụaka ahụ n'oge adịghị anya.
Ka ọ dị ugbua, enweghị onye ma ebe ụmụakwụkwọ 165 ndị so na ndị a tọọrọ nọ.
Dayọsis Ụka Katọlik na Kontagora, Niger steeti wepụtara aha ụmụakwụkwọ ahụ na ndị nkụzi a tọọrọ n'ụlọakwụkwọ ahụ. Ha kwuru na ọ bụ mmadụ 265 ka ndị ojiegbe ahụ tọọrọ nke gụnyere ndị nkụzi ise. Ndị na-abụghị ndị nkụzi asaa, ụmụakwụkwọ sekọndri 14 na ụmụakwụkwọ ọta akara na pramarị 239.
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Fraịde Nọvemba 21, 2025 ka ndị ojiegbe wakporo ụlọakwụkwọ ahụ ma tọrọ ụmụakwụkwọ na ndị nkụzi ahụ.

Ihe Gọọmenti megoro maka ụmụakwụkwọ 265 a tọọrọ na Naịjia steeti – Archbishọp Yohana

Onyeisi otu jịkọrọ ndị okpukperechi Kraịst na Naịja steeti bụ Archbịshọp Bulus Dauwa Yohana gwara BBC okwu banyere nghọtahie dapụtara mgbe ndị ojiegbe tọọrọ ụmụakwụkwọ na steeti ahụ.
Nghọtahie ahụ bụ mgbe Gọvanọ Naịjia steeti kwuru na ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ a tọọrọ n'ụlọakwụkwọ St. Mary's dị na Papiri, n'okpuruọchịchị Agwara pere mpe karịa ọnụọgụgụ ndị ụka na-ekwu na a tọọrọ.
Bulus Yohana bụ onyeisi otu jịkọrọ ndị ụka Kraịst bụ Christain Association of Nigeria na Naịja steeti ma bụrụkwa Archbishop nke Kontagora.
Ọ kọwaara BBC etu ọnọdụ ụmụakwụkwọ ahụ a tọrọ n'ime ihe dịka abalị atọ a tọọrọ ha ma nyekwa nkọwa banyere ụmụakwụkwọ iri ise ahụ gọọmenti sị na ha gbapụtara n'aka ndị ntọrị ma nyefee n'aka ezinaụlọ.
N'okwu ya "amaghị m ihe ọzọ gọọmenti mere maka ịgbapụta ndị ahụ karịa ịnara anyị aha ha".
Ọ gara n'ihu kwuo na enweghị mgbe ọbụla a sị ha mechie ụlọakwụkwọ ha maọbụ na ha mepere ya na-enweghị ikike.
Ọ kọwara na ọ bụ ndị nkuzi nakwa onyeisi nkuzi n'ụlọakwụkwọ ahụ nyere ya ndekọ mmadụ iri na ise ahụ na-esoghị na ndị a tọọrọ.
Etu anyị si chọpụta mmadụ ole a tọọrọ
"N'oge ihe a mere ị mara na o mere n'abalị. Ọtụtụ n'ime gbara ha mbọ ka ha gbalaga. Ị ma na ọ bụ ihe na-eyi egwu, agaghị agwa ndị mmadụ ihe ha ga-eme".
"Mana mgbe anyị bidoro ịgụ ha ọnụ. Anyị gụtara ọnụọgụgụ mmadụ narị atọ na atọ bụ ụmụakwụkwọ nakwa ndị ọrụ anyị mmadụ iri na abụọ mere ya mmadụ narị atọ, iri na ise".
"Mgbe anyị na-ahụghị ndị ahụ gbara ọsọ anyị chere na ha so na ndị a tọọrọ mana ka ọ gafere abalị ole ma ole ka anyị bidoro na-enweta ozi, ezinaụlọ ha na-ezita n'ekwenti".
"Mgbe ahụ ka a chọpụtara na mmadụ iri ise esoghị na ndị a tọrọ .Ọnụọgụgụ ndị a tọọrọ gbadatara ma bụrụ narị abụọ, iri isii na ise".
Ị ga-asị na a kpachaara anya na-awakpo ndị ụka Kraịst na Naịjirịa?
N'ihe gbasara mkpagbu na mwakpo ndị ụka Kraịst na Naịjirịa, Archbisọp Yohana kọwara na ọ bụ ihe mmadu ga-aza ajụjụ ya site n'ihe na-eme n'ebe onye ahụ bi.
N'okwu ya "aga m ekwu maka ihe na-eme n'ebe m bi".
"Ọnọdụ anyị nọ n'ebe a bụ ọnọdụ mkpagbu. Adịghị ekwe ka anyị nweta ọtụtụ ihe ọkachasị ndị ụka".
"Tupu anyị arụọ ụlọụka anyị ga-agafe ọtụtụ ihe cheere znyị aka mgba".
"Ọtụtụ oge ka anyị ga-azụta ala, ndị anyị zụnatara ya ewegachịta ego anyị azụ. Nke a bụ etu ha si akpa oke" .
Ị chere na nke a ga-emetụta ụmụakwụkwọ ịga akwụkọ na Naịja steeti?
Naịja steeti no na ndị nwere ụmụaka na-adịghị aga ụlọakwụkwọ ọnụọgụgu ha kachasị na Naịjirịa, i chere na nke ga-eme ka ụmụaka na-atụ ụjọ ịga ụlọakwụkwọ?
Nke a bụ eziokwu maka na ọtụtụ ndị a tọrọ bụ ndị si ime obodo bịa ịgu akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ anyị.
I lee anya ị ga-amara na ọdịghị mfe ha idebanye aha n'ụlọakwukwọ anyị.
Pasenti iri itoolu na ise n'ụmụakwụkwọ anyị nwere si na n'ime obodo. Ha nụ ihe mere ndị nke bịara akwụkwọ, egwu agaghị ekwe ha bịa akwụkwọ ọzọ maka egwu ndị ntọ.












