Guinea-Bissau: Umaro Sissoco Embaló agbagaala mba Senịgal dịka ndịagha napụrụ ya ọchịchị n'ike

Ndịagha ahụ napụrụ Onyeisiala Umaro Sissoco Embalo ọchịchị n'ike n'ụbọchị Wenezde 26 Nọvemba, 2025

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Umaro Sissoco Embaló e wepụrụ dịka onyeisiala mba Guinea-Bissau awuchiela mba Senịgal. Nke a na-abịa dịka ha na otu Ecowas nwere nkwekọrịta.

Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ozi si na mịnịstrị mba Senịgal na-ahụ maka mmekọ mba ofesi, kwuru na ụgbọelu bu Embaló batara na Senịgal n'ụbọchị Tọzde 27 Nọvemba, 2025.

Cheta na ndịagha wepụrụ Umaro Embaló na ndị ọrụ ya n'ụbọchị Wenezde 26 Nọvemba, 2025 dịka a na-atụ anya mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere na mba ahụ.

Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ọ bụ Umaro Embaló ga-enweta mmeri na ntuliaka ahụ.

Ka ọ dị ugbua, e duola Ọchịagha Horta N'Tam n'iyi ọrụ dịka onyeisiala mba ahụ.

E duola Ọchịagha Horta N'Tam n'iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Guinea-Bissau

Aha onyonyo, Guinea-Bissau Coup: E duola Ọchịagha Horta N'Tam n'iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Guinea-Bissau
Oge e duru Ọchịagha Horta N'Tam n'iyi ọrụ

Ebe foto si, Getty Images

Ndịagha weghara ọchịchị n'ike na mba Guinea-Bissau, eduola otu onye ọchịagha n'iyi ọrụ dịka onyeisiala.

E duru Ọchịagha Horta N'Tam n'iyi ọrụ n'ụbọchị Tọzde 27 Nọvemba, 2025 na Bissau b isiobodo Guinea Bissau.

Nke a na-abịa dịka ndịagha ahụ napụrụ Onyeisiala Umaro Sissoco Embalo ọchịchị n'ike n'ụbọchị Wenezde.

Otu Ecowas akatọọla nnapụ ọchịchị n'ike ahụ ma kpọọ oku ka a tọhapụ Onyeisiala Sissoco Embaló .

Oge e duru Ọchịagha Horta N'Tam n'iyi ọrụ

Ebe foto si, Getty Images

Guinea-Bissau Coup: Ndịagha sị ha ewerela ọchịchị n'ike dịka ha nwuchiri Onyeisiala Embaló

Ndịagha na-agbasa ozi n'igwe TV

Ebe foto si, AFP via Getty Images

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Otu Ndịagha ekwuola na ha ewerela ọchịchị n'ike na mba Guinea-Bissau dịka akụkọ na-ekwu na a nwuchiela Onyeisiala ha bụ Umaro Sissoco Embaló.

Nke a na-abịa dịka a nụchara ụda egbe n'isi obodo ahụ bụ Bissau, otu onye ọrụ gọọmentị gwara BBC na a nwuchiela Embaló.

Akụkọ a na-abịa n'ime ụbọchị atọ e mechara ntuliaka ọkwa onyeisiala mba ahụ bụ nke a kagburu onye na-ama gọọmentị aka isonye zọọ ọkwa ahụ.

A na-atụ anya na mpụtara ntuliaka ahụ ga-apụta ihe n'ụbọchị Tọzde – mana Embaló nao nye na-ama ya aka kwuru na ọ bụ ha nwee mmeri na ntuliaka ahụ.

Onye hụrụ ka ihe si mee na Bissau kwuru na ụdaegbe dara aghara aghara n'elekere otu nke ehihie Wednezde mana o dochaghị anya ndị na-agba egbe ahụ nakwa ndị merụrụ ahụ.

Ụlọọrụ ntaakụkọ AFP kwuru na ọtụtụ puku ndị mmadụ gbara ọsọ aghara aghara ma ndị ji ụkwụ ma ndị ji ụgbọala na-achọ ebe ha ga-ezo.

Guinea-Bissau nwere ọnụọgụgụ mmadụ na-erughi nde abụọ so na ndị kachasị daa ogbenye n'ụwa. A nwaala ugboro itoolu iwere ọchịchị n'ike na mba a kamgbe afọ 1980 na mba nweere onwe ya site n'aka Portugal.

A nwabuola ichutu Embalo n'ọkwa ọchịchị n'ọnwa Disemba afọ 2023 mana ọ kụrụ afọ n'ala.

Ihe dị mkpa banyere Onyeisiala Embalo

‎Umaro Sissico Embalo yi uwe ọcha n'ime kpọrọ nkechiolu 'tie' ma yikwasị ya uwe na-acha anụnụ anụnụ.

Ebe foto si, Getty Images

A họpụtara ‎Umaro Sissico Embalo dịka Onyeisiala mba Guinea-Bissau n'afọ 2019.

N'afọ 2020, ka nwamadị a bụbu praịm mịnịsta banyere n'ọchịchị ka o merichara na ntuliaka iji gbanwee ọchịchị afọ iri anọ na isii ndịagha chịrị mba ahụ.

N'afọ 2023, Onyeisiala Embaló kposara ọchịchị ụlọomeiwu bụ ndị ma ya aka nọ n'isi ya n'ihe na-erughi ọnwa isii e hiwere ha n'ihi egbe a gbara nke o kwuru sị na ha chọrọ ịnapụ ya ọchịchị n'ike.

Embalo bụ onyeisiala mba Guinea-Bissau mbụ a ga-ahọpụta na-enweghi nkwado pati PAIGC.

E meela ọtụtụ iwere ọchịchị n'ike na mba ahụ kamgbe afọ 1980 rute ugbua, ha enwebeghi ezumike n'ọnọdụ nchekwa.

Ebe ndịagha weerela ọchịchị n'ike n'Afrịka

Ndịagha ewerela ọchịchị n'ike ọtụtụ ugboro na mba ndị dị n'Afrịka. Mgbe ọbụla nke a mere ha na-ekwu na ọ bụ n'ihe ụbịam na ndakpọ akụnaụba kpalitere mmụọ ha ime nke ahụ.

Otu nnyocha e mere gosiri na ndịagha ewerela ọchịchị n'ike ugboro iri asatọ na mpaghara 'sub-Sahara' nke Afrịka.

Nke a emeela na mba ndị dịka Uganda, Côte d'Ivoire, Niger, Sierra Leone, Rwanda, Zimbabwe na ndị ọzọ.

Nke a mere na Guinea-Bissau, emeela ka ha soro mba dịka Niger, Burkina Faso na Mali bụrụ mba ndịagha na-achị.