Niger Coup: Mmachi Ecowas tinyere emetụtawala Niger- Abdusalam Abubakar

Generalụ Abdulsalam Abubakar

Ebe foto si, Getty Images

Onye mbụụzọ Ndịda Afrịka n’okwu gbasara nsogbu dị na Nijie, Generalụ Abdulsalami Abubakar ekwuola na okwu iji ndịagha ga Nijie ga-abụ nanị a hụghị ka e mere.

Abubakar kwuru na ndị ya na ya soro gaa Nijie n’aha otu Ecowas maka ịkpa udo na onyeisi ọchịchị ndịagha mba ahụ bụ Generalụ Abdourahmane Tchiani akpawala.

Tchani maburu ọnwa atụmatụ inyefe ọchịchị n’afọ atọ na-abịa. mana Ecowas anabataghị nke ahụ.

Ọdịda Anyanwụ Afrịka bere ebere dịka onye ndị ọchịchị ndị agha gbara isi akwara na-agbanyeghị mmaja iji ndịagha bịa ọgụ iweghachi ọchịchị n’aka ndị nkịtị.

Dịka Ecowas na-ekwusi ike na ụzọ nile ka ghe oghe, ọkwa ahụ ọchịchị ndị Kakị mara tinyere ụfọdụ ndị ndu mba dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka obi abụọ n’ime dịka ụfọdụ amaghịkwa ebe ha ga-akwụ akwụ.

Abubakar gwara BBC sị, “ A ga-esi ụzọ abụla ụzọ weghachi ọchịchị dịka iwu sịrị kwuo na Nijie.”

“Ọ bụghị iwu na aga e ji aggha mana o nweghị onye na-akwado agha maka na i bido agha, ị maghị ihe ọ ga-apụta.”

Abubakar zutekwara Onyeisiala a chụturu bụ Mohamed Bazoum bụ onye o kwuru gosiri obi mwute etu e si akpaso ya agwa.

Onyeisi ndịagha Niger ekwela ka ya na Ecowas nwee mkparịtaụka

Ndị ndu okpukperechi Alakuba

Ebe foto si, EL HAJ

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onyendu ndịagha weere ọchịchị n'ike na mba Niger bụ ọchịagha Abdourahamane Tchiani ekwuola na ọ dị njikere ka ya ndị ndu otu Ecowas nwee mkparịtaụka.

Nke a na-eso njem ụfọdụ ndị ndu okpukperechi Alakụba Naịjirịa mere na mba Niger n'ụbọchị Satọde 12 Ọgọọst 2023 iji weta udo n'etiti ndịagha Niger na ndị otu Ecowas.

Ndị ndu okpukperechi a nke Sheikh Abdaullahi Bala Lau bụ onyedu otu Izalla Organisation nke Naịjirịa nọ n’isi ha na ndịagha Niger nwere mkparịtaụka udo ruru awa atọ.

Sheikh Bala gwara BBC na ndịagha rịọrọ mgbaghara maka egeghi ndị ndu nke onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa ọchịagha Abdusalami Abubakar kpọọ bịa ntị.

“Mwepu ọkụ latrik nakwa mmechi ụzọ ibubata nri Ecowas mechiri mere ka obi dị ndị mmadụ njọ nke butere ngagharịiwe, iji mee ka ọgbaghara ghara ịdapụta, ọ bụ ya mere enyeghi ha ohere ịgwa ha okwu, mana ha kwuru ka e nweere ha ndịdị,” ka Bala Lau gwara BBC.

A bịa na uru ha nwetere na njem ahụ, Bala Lau kwuru na he emepeela ụzọ maka mkparịtaụka udo, maka na ndịagha ekwuola na ha dị njekere ugbua ịnabata ndị nnọchịteanya Ecowas n’oge ọbụla.

Ndị ndu okpukperechi Alakụba na Naịjirịa

Ebe foto si, EL HAJ

Onye nabatara ndụ ndu okpukperechi a na mba Niger bụ praịm minista ọhụrụ nke mba ahụ bụ Ali Mahaman Lamine Zeine ebe ha na ọchịagha Abduourahamen Tchiani, onye ndu ndịagha kpachiri ọchịchị nwere mkparịtaụka.

Bala Lau gara n’ihu kwuo “anyị kọwaara uru dị na mmekọrịta Naịjirịa na Niger, na ọ bụ ihe malitere kamgbe ọtụtụ afọ gara aga”.

Tupu ndị ndu okpukperechi emee njem a, ha na Onyeisiala Bola Tinubu nke Naịjirịa zutere n’Abuja n’izuụka gara ịkpa nkata maka njem ahụ.

Ndị ọzọ so mee njem a gụnyere Sheikh Kuremebullahi Nasiru Kabara, Sheik Ibrahim Dahiru Bauchi, Ọkammụta Khalid, odeakwụkwọ nke Jama'atu bụ Nasril Islam, Ọkammụta Salisu Shehu na ndị ọzọ.

Cheta na Ecowas yiri egwu iji ndịagha wakpoo mba Niger ma ọ bụrụ ndịagha enyeghachịghị ọchịchị n’aka Onyeisiala Mohamed Bazoum.

Otu African Union, United Nations nakwa European Union kwadoro mkpebi ọbụla ndị Ecowas mere banyere mba Niger.

Nigeria nwere ọtụtụ agha n'ụlọ, anyị achọghị agha ọhụrụ -Abeboye

Pastọ Enoch Adeboye

Ebe foto si, Enoch Adeboye/Facebook

Dịka otu jịkọrọ mba nọ n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ 'Economic Communities of West Africa'(Ecowa) nke Onyeisiala Bola Tinubu bụ onyeisioche ha na-ejikere iji ndịagha gaa ọgụ na Nijie, otu ụkọchukwu Naijiria a ma ama ekwuola na onye ụlọ ya na-agba ọkụ anaghị achụ oke.

N'ozi ya na nnukwu ọgbakọ ụka ya (Annụal Holy Ghost Convention) na-eme kwa afọ n'Ọgụn steeti n'ụbọchị Satode, Pastọ Enoch Adeboye bụ ụkọchukwu na-edu ụka 'Redeemed Christian Church of Christ(RCCG) kwuru na ọtụtụ nnukwu agha cheere Naijiria aka mgba n'ụlọ, na ọ dịghị mkpa ị ga koro ọzọ.

N'ụbọchị Tozde, otu Ecowas kpebiri iji ndịagha manye ndịagha weghaara ọkwa ọchịchị n'ike na mba Nijie ka ha rituo dịka ndịaghụ jụrụ ihube isis na ohere abalị asaa e nyere ha ka ha nyeghachi Onyeisiala Mohamed Bazoum nke Nijie bụ onye ha chụdachara n'ọkwa n'abalị 27 nke ọnwa Julai afọ 2023.

Mana Adeboye sịrị na, “Anyị ka na-alụ agha megide agụụ. Anyị nwegara agha kara aka anyị na-alụ, anyị achọghị ndị ọhụrụ, ma n'ime Naijiria maọbụ maọbụ na mba ọzọ."

Adeboye, onye gbara ama na ya bụ nwata oge a lụrụ Agha Biafra rụtụrụ aka na na-agbanyeghị na ya agaghị ọgụ dịka onyeagha, na ya hụrụ agha nke mere na enye ya ohere hara, na ya ga-ahara udo karịa agha ụbọchị ọbụla.

Ọ sịrị, “Naijiria chọrọ nnukwu ekpere. Abụ m nwatakịrị nwoke mana a nọ n'ihu agha oge Agha Brafra. Ọ bụghị dịka onyeagha, kama anyị bi nso n'ihu ọgụ."

"Ihe m ji anya m hụ, nwee onye sị m họrọ n'etiti agha na udo, aga m ahọrọ udo."

Ecowas nwere ndịagha nke a na-esi na ndịagha mba dị iche iche nọ n'otu ahụ adọrọ mana Naijiria ka ọnụọgụgụ ndịagha ya kachasị n'ebe nile ndịagha Ecowas garala ọgụ udo dịka na Liberia, Gambia na Siera Lionụ.

Russia asaala Ecowas

Vladimir Putin

Ebe foto si, Getty Images

Mba Rọshịa adọọla otu jịkọrọ mba nọ n'Ọdịda Anyanwụ Afrịca bu 'Economic Communities of West Africa'(Ecowas) aka na ntị ka ha ghara iji ndịagha so ndị ndịagha kwaturu ọchịchị n'ike na mba Nijie, si na nke ahụ ga-eme "ka okwu too ogologo".

Nkwupụta a na-eso mkpebi Ecowas mere ụbọchị Tozde isi ndịagha na Nijie.

Mba Amerịka nakwa otu 'African Union kwadoro mbọ iwegha chi Mohamed Bazoum a chụturu n'ọkwa.

Ndị Nijie na-eme ngaghariiwe megide Fransi Ecowas

Ebe foto si, Getty Images

Mana Rọshịa ekwupụtaghị nkwado ya nye nkwatu ọchịchị ahụ mana a na0eche na esemokwu so ya nwerre ike ibute esemokwu n'etiti ha na mba ndị nọ n'Ọdịda Anyanwụ Yorup.

N'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Fraide, Mịnịstrị mba Rọshịa na-ahụ maka mmekọrịta ha na mba ndị ọzọ dọrọ aka na ntị sị, "Anyị kwenyere na iji ndịagha gaa idozi okwu na Nijie ga-eme okwu ga-anọ ogologo oge na mba ahụ nakwa mpaghara Afrịka dị na Sahara-Sahel nile."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Mba Fransi na Amerịka nwere ogige ha na Nijie bụ ebe ha si ebuso ndịagha nnupuisi jihad agha.

Ndị na-akwado ọchịchị ndịagha Nijie akpoola oku ka ndị Ọcha nọ na mba ha pụọrọ ha ma kwupụta nkwado ha nye Rọshịa.

N'ụbọchị Fraide, ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe gara n'ogige ndịagha mba Fransi dị na Nijie na-agụ ekwu si, "Fransi gbakwa ọkụ, Ecowas gbakwa ọkụ."

.

US, AU adọnyerela Ecowas ukwu n'okwu iji ndịagha gaa Niger
Anthony Blinken na Mousa Faki Mahamat

Mba Amerịka nakwa otu jikọrọ mba ndị dị n'Afrịka bụ 'African Union'(AU) adọnyerela otu jịkọrọ mba nọ n'Ọdịda Anyanwụ Afrịca bu 'Economic Communities of West Africa'(Ecowas) aja n'ukwu na mkpebi ha iji ndịagha gaa ọgụ na Nijie.

Ha kpọkwara oku ka a tọhapụ Onyeisiala Mohamed Bazoumm nke Nijie bụ onye ndịagha mba ahụ nwụchiri kemgbe abalị 26 nke ọnwa Julai afọ 2023 bụ ụbọchị ha kwaturu ya n'ọkwa ọchịchị.

Otu Ecowas kpebiri n'ụbọchị Tozde n'ọgbakọ ha nwere n'Abuja, Naijiria, iji ndịagha chụda ọchịchị ndịagha na Nijie dịka ha jụrụ inyeghachi Bazoum bụ onyeisiala ha kwaturu n'ọkwa ikike ọchịchị.

Odeakwụkwọ na-ahụ maka mmekọrịta Amerịka na mba ndị ọzọ bụ Anthony Blinken kwuru n'ozi o wepụtara n'akara ya na n'ọbaozi Twitter n' ụbọchị Fraide sịrị, "Amerịka kwadosiri ike ebe ndị ndu Ecowas kwụ n'iweghachi ọchịchị ka ọ dị n'iwu ala Nijie nakwa na ntọhapụ, na-egbughị oge, Onyeisiala Bazoum."

N'otu aka ahụ, Onyeisioche otu AU bụ Moussa Faki Mahamat kwụpụtara ezi nkwado ya nye "mkpebi nile Ecowas nwere banyere mgbanwe ọchịchị na Nijie n'ụzọ agbasoghị iwu".

Mahamat kpọkwara oku ka ndị ọchịchị ndịagha nọ n'Afrịka sepụ aka enwe n'ofe n'ịmụnye oku na mmekọrịta dị n'Otu Ecowas.

Ọ gara n'ihi kpoo oku ka a tọhapụ Bazoum nndị ezinaụlọ ya nakwa ndị ọchịchị ya e ji eji.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Ivory Coast ekwuola ndịagha ole ha ga-eziga Niger

Alassane Ouattara

Ebe foto si, Getty

Onyeisiala mba Ivịrị Kost ekwuola na ha ga-eziga otu puku ndịagha ga-esonye ndịagha mba ndị ọzọ nọ na Ecowas maka ọgụ na mba Nijie.

Alassane Ouattara kwuru nke a na ọgbakọ mberede nke ndị ndu otu Ecowas nwere n'Abuja ụbọchị Tọzde bụ ebe otu ahụ nyere ntuziaka iziga ndịagha na Nijie iji weghachi ọchịchị n'aka ndị nkịtị.

Ouattara sịrị na Ecowas chọrọ ka onyeisiala mba ahụ bụ Mohammed Bazoum, laghachie n'ọkwa ya.

O kwuru na ndịagha si Naijiria, Bene nakwa mba ndị ọzọ ga-esonye Iviri Kost n'atụmatụ ahụ.

Ecowas ekpebiela iziga ndị agha na Niger na ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ ha kpebiri

Ndị ndu mba dị n'otu Ecowas

Ebe foto si, @Dolusegun/Twitter

Otu jịkọrọ mba ndị nọ na Ndịda Anyanwụ Afrịka a kpọrọ 'Ecomimic Community of West African States'(Ecowas) ekwuola na ha agụpụbeghị kpamkpam iji ndịagha chụda ọchịchị ndịagha na mba Nijie.

N'abalị 26 nke ọnwa Julai afọ 2023, ndịagha Nijie chụturu Onyeisiala ha bụ Mohammed Bazoum n'ọkwa ma weghara ọchịchị n'ike.

Aha onyonyo, Ihe ụfọdụ ụmụafọ Afrịka na-ekwu maka atụmatụ Ecowas iziga ndịagha ha na mba Niger
Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Mana n'ọgbakọ nke ndị ndu Ecowas nwere n'Abuja n'ụbọchị Tọzde, abalị 10 nke ọnwa Ọgọstụ, afọ 2023, ha kpebiri iji ndịagha Ecowas gaa ebe ahụ.

Otu ahụ rụtụrụ aka na mbọ nile ha gbara ka e jiri nwayoo dozie okwu ahụ amịtaghị mkpụrụ dịka ndị ndu agha mba ahụ gbara isi akwara, jụ inyeghachi Bazoum ọchịchị dịka Ecowas si nye ha ntuziaka.

Ozi Ecowas wepụtara ka ha mechara nzukọ ahụ sịrị na ha, "ekpebiela iziga ndịagha ECOWAS ịga weghachi ọchịchị na Nijie dịka ọ dị n'iwu."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Lee mkpebi ndị ọzọ

Ha rụtụrụ aka na, "Katọsiri ike mweghara ọchịchị n'ike nke ndịagha Nijie mere nakwa ịga n'ihu ha ijichi Onyeisiala Nijie bụ Mohammed Bazoam, ezinaụlọ ya nakwa ndị ọchịchị ya megidere iwu obodo."

Ecowas kwukwara na ha, 'Kwụsiri ike n' atụmatụ nakwa usoro nile ha kwekọrịtara n'ọgbakọ ha nwere n'abalị 30 nke ọnwa Julai, afọ 2023 banyere Nijie isi taa.

Dịka ha kwụpụtara njikere ha ka e dozie okwu a na n'ụzọ nwayọọ, ha kwusịrị ike n'ịgbachi agbata mba ha na nke Nijie, mmachi njem ụgbọelu nakwa ịkpachi ego ndị maọbụ otu ọbụla ga-abụ ọgbatauhu=ie na iji udo dozie okwu a.

Ecowas dọkwara mba ndị dị n'otu aka na ntị manyere ịkpa agwa ọbụla nwere ike igbochi ikpezi okwu dị na Nijie n'udo.

Ha kpouru otu African Union nakwa United Nation ka ha dọnyere Ecowas ukwu iji hụ na e weghachiri ọchịchị na Nijie dịka iwu sị dị.