Etu ndị ojiegbe si suo ụlọ Onyeomeiwu ọkụ n'Imo steeti

Ebe foto si, Jerry Alagbaso
Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ha na-ama imi n'ala iji chọpụta ndị suru ụlọ onyeomeiwu ọkụ n'Ihittenasa dị n'Okpuru Ọchịchị Orsua steeti ahụ na nsonso a.
Ndị ojiegbe suru ụlọ onye bụbu omeiwu na-anọchite mpaghara Orlu/ Orsu/ Oru East n'Ụlọnnọchitenaya bụ Jerry Alagbaso.
Alagbaso bụ onye nọchitere mpaghara ahụ afọ 12 anọghị n'ụlọ ya oge ndị ọchọnganoko ahụ bịara ije ha mana ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị omekome ahụ wakporo ụlọ onye omeiwu ahụ n'abalị Tuzde oge ndị mmadụ nọ n'ụra zụọ ọtụtụ ihe ma mụnye ụlọ ahụ ọkụ.
Onye nche na-eche n'ụlọ ahụ zọtara ndụ ya mana ọ merụrụ ahụ.
Onyeisi otu achụmtavootu Agbaso bụ Unama Olemgbe gwara onye ntaakụkọ anyị n'ekwentị na ụlọ ahụ gbara pịapịa.
Ọ sịrị, " Akụkọ ahụ bụ eziokwu. ọkụ gbara ihe nile site na mgbamgbam rue n'akụkọ ebe ndị ọzọ n'ụlọ ahụ. Onye nche nọ ya oge o mere merụrụ ahụ dịka ọ gbapụrụ."
Ọnụ na-eekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Henry Okoye bụ onye kwụkwara na ya bụ ihe mere n'ezie sịrị, "Kọmishona ndị uweojii akatọọla agwa ọjọọ ahụ ma nye iwu ka achọwa ndị sunyere ụlọahụ ọkụ."
" Aka anyị ga-akpara ndị omekome ahụ, ha ga agakwanụ ụlọikpe ịzara ọnụ ha."











