Baby care cost: Ego ole ka ịmụ nwa n' ulọọgwụ, zụọ ihe nwa, nri nakwa uwe nwa ga-eri onye na mụ nwa mbụ ya ugbua?

Nwaanyị dị ime na nwa ya

Ebe foto si, Getty

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist

Otu n'ime ihe ndị kachasị adị ndị mmadu na mpaghara Afrịka mkpa ha ji alụ nwaanyị maọbụ di bụ ịmụta nwa.

Nke a pụtara ihe na aha ha na-agụ ụmụaka: Nwabụeze, Nwamaka dgz,

Ya mere ekpere ọmụmụ so n'ihe na-abụ isiokwu na mmemme alụmdinanwunye n'ala Igbo.

Mana ị ma na dịka ọnọdụ akụnaụba Naijiria dị ugbua, okwu ịmụ nwa bụ egwu onye ọ kara obi, ọ bụghị ọgụ a gba aka alụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Nke a bụ n'ihi ọnụahịa ọtụtụ ihe gụnyere ihe e ji amu ma zulite nwa arịala n'elu ọjị.

Dịka ngụkọ nke ụlọọrụ 'National Bureau of Statistics' (NBS)si kwuo, ọnụahịa ihe na-ada n'ahịa nke Bekee kpọrọ 'inflation rate' ji pasent 4.19 karịa ihe ọ bụ na Juun afọ gara aga dịka ọ rịrị rue pasent 22.79 (22.79%) n'ọnwa Julai, afọ 2023 site na pasent 18.60(18.60%) ọ bụ n'ọnwa Juun afọ 2022.

Ọ bụrụ na ị lụrụ nwaanyị maọbụ di ọhụrụ, na-akwado ezinaụlọ nke gị, mata na ịmụ nwa ugbua abụghị egwu a chị ụtaba n'aka agba.

Igbo sị na agha a kara aka anaghị eri ngwọrọ.

Dịka gị na onye nke gị na-arị elu akwa, arịtu, bịa ka anyị tupe nye gị azụ ihe ndị chere gị n'ihu ma goolu gaa:

Dịka nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na ọ ga-eri agbata otu nde naira na nde abụọ (N1-N2 m) ịmụ nwa ma zuro ya afọ abụọ.

Nke a gụnyere ego a na-emefu na nleta akụike nne na nwa n'oge ịmụ nwa, akọrọngwa e ji eleta nwa, nri nwa nakwa akwa ya.

Ọ na-eri ihe dịka agbata puku naira iri ise na puku nari naira ise ịmụ nwa n'ụlọọgwụ.

Okwu nleta ahụike nne na nwa

Nne na nwa

Ebe foto si, Iwaria

Dika Dọkịta ahụike ụmụnwaanyị n'ụlọọgwụ"University of Nigeria Teaching Hospital(UNTH), Enugwu bụ Dkta Kingsley Ekwuazi si kwuo," Ịmụ nwa n'ụlọọgwụ nwere ike iri gị agbata N20,000 na N100,000 maka onye mụrụ onwe ya nwa."

" Mana ọ bụrụ onye a wara afọ, ọ ga-ewe agbata N100,000 na N400,000."

Dkta Kingsley Ekwuazi

Ebe foto si, Kinsley Ekweazu

Nkọwa foto, Dkta Kingsley Ekwuazi bụ ọkaibe n'ahụike ụmụnwaanyị n'ụlọọgwụ UNTH, Enugwu

Dkta Ekwuazi kọwara na ego a na-emefụ n'ụlọọgwụ nwekwara ike ịkarị nke a ma ọ bụrụ na nne maọbụ nwa ọhụrụ nwee nsogbu ma amụpụta ya.

" Ọ bụrụ na nwa ebeghị akwa ọfụma maọbụ nwee ịba ọchananya(jaundice) , i nwere ike ịkwụ agbata N10,000 maọbụ N20,000 kwa ụbọchị maka 'phototherapy' nke nwere ike iwe abalị asaa maọbụ iri tupu nwata ahụ agbasie ike."

Ihe nwa ọ na-ada gịnị n'ahịa?

Otu nwaanyị na-ere ihe ndị e ji amụ nwa n' Ijanikin, Legọs, bụ Diamond Ujuora Simon gbara ama na, "Dịka aka onye ha, ọ ga-eri ndị na-akwado ezinaụlọ ihe dịka agbata narị naira abụọ na ọkara na otu nde naira (N250,000- N1,000,000 ) ịzụ ihe nwa."

Simon kọwara na ụfọdụ akọrọngwa bụ ihe bụ iwu na ị ga-enwe ya, nwee nke bụ ndị rijuru afọ na-azụ ya.

Ihe nwa

Ebe foto si, Ujuora Simon

Otu nwaanyị bi n'Enugwu ku nwa ọnwa atọ n'aka achọghị ka a kpọ aha ya kọwara, "Oge m mụrụ nwa, o riri m ihe ruru narị puku narị naira abụọ(N20000 (n'ihi na e ji ịwa ahụ amụ nwa."

Ihe nwa

Ebe foto si, Ujuora Simon

Nke a bụ n'ihi na ọ bụ ụlọọgwụ gọọmentị, ọ bụrụ nke ụlọọgwụ nọrọ onwe ha, ọ ga-eri gị puku nari naira atọ(N300,000)."

Nri nwa sọ n'ihe ọzọ na-ata ego n'ịzụ nwa

Nri nwa

Mmiri ara ehi e mere maka ụmụaka e ku n'aka na-ada agbata puku naira abụọ na ọkara na puku naira asaa maka otu komkom.

Ụfọdụ ụmụaka na-aṅụ otu komkom n'abalị otu izuụka maọbụ abụọ, dịka afọ nri ha si dị.

Ndị dọkịta na ndị ọrụ ahụike na-enye ndụmọdụ ka e nye nwa ọhụrụ naanị ara were rue ọnwa isii.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

E wezụga ichekwa ahụike nwata e ji naanị mmiri ara nne ya zụọ ka ọ gbasie ike, ma mee ka ụbụrụ ya na-acha ọkụ, ọ na-ewezụgara nne na nna mụrụ nwa ahụ mmefu ego ịzụ nri nwa na ọnwa isii mbụ ya.

Mana mgbe ụfọdụ, ụfọdụ anaghị emeli inye nwa ọhụrụ nani ara nihi mkpa dị iche iche maọbụ mkpebi ha.

Otu nwaanyị nwa ọhụrụ dị ọnwa atọ achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo na ya na-enye nwa ya mmiri ehi na-agbanyeghị na ọ dị nani ọnwa atọ iji gbochie ibu oke ibu.

"Ekpebiri m inye nwa m bụ nke atọ m mmiri ara ehi n'ihi na achọghị m ibu oke ibu."

Ude nwa

Nwaanyị ahụ onye gbara ama na inye ụmụ abụọ o buru ụzọ mụọ ara mere ya buo oke ibu ya, kwuru na " Ana m enye ya nri nwa 'Nan' nke a na-ere puku naira anọ(N4000) maka otu nkomkom nke ọ na-eri rue izuụka abụọ."

"Anaghị m enye ya naanị ara m ."

Nwa ọhụrụ rue ọnwa isii, a na-amalite inye ya nri Bekee kpọrọ 'cereal.'

Nke a ga-erikwa ndị mụrụ nwa ọhụrụ agbata puku anọ na puku naira asaa (N4000-7000) kwa izuụka maọbụ kwa izuụka abụọ.

Ụfọdụ na-agwa ya nri ndị okenye na-eri iji belata ego a na-emefu ịzụ nke Bekee.

Nwa ọhụrụ

Ebe foto si, Iwaria

E tere ogiri, e tere ụgba, a gaghị eji mgbagbu ghara ọgụ.

Agaghị e ji maka mgbali ọnụahịa ịzụlite nwa ọhụrụ, hapụ ịmụ nwa.

ụfọdụ na-ekwu na ịhazi nwa olee onye ga-amụ ka mma iji nwee ohere leta ha anya nke ọma kacha mma.

Otu nwaany ji ụmụ abụọ dị afọ ịrị na afọ abụọ bụ Ngozi Ekene dụrụ ndị na-ebido ọhụrụ ndụmọdụ sị, " Mee oke ike gị ha. Nye nwa ara rue ọnwa isii, kama ịgba isi akwara ịzụ mmiri ara ehi si Ala Bekee, e nwere nri na-enye ihe n'ahụ na be anyị karịa, dịka akamụ, soya beaans and nri ndị ọsọ."

Lee mgbarị ego ọ ga-eri gị

Techa techa nwa

Ebe foto si, Ujuora Simon

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

*Nleta ahụike*

1. Ịmụ nwa: N20,000-N100,000

2. Iji ịwa ahụ mụ nwa: N100,000-400,000

3. 'Phototherapy' N70-140,000

(maka ịgwọ ịba ọchananya)

*Akọrọngwa e ji amụ nwa*

1. Akpaara nwaanyị na-enye nwa ara : N3800

2. Akpa mmiri ọkụ(hot water bottle) : N3500

Ọba e ji asa nwa ahụ (baby bowl): N7500

3. Akwa nwa : N2500

4. Igbe akwa nwa(baby cabinet): N12,000-35,000

5. Techatecha nwa(baby cosmetic set): N 5000.

6. Akwa nwa x mkpụrụ 20 @ N 1500. : N30,000

7. Akwa nwa( Overall) mkpụrụ 30: N 30,000

8.Dele cotton swabs &balls: N3500

9. Nightingale pad: N3000

10. Lady Sept pad: N1000

11. Dettol( 250 mil): N1500

12. Mentholated spirit: N1000

13. Goya oil : N1500

14. Mucus extractor: N500

15. Detergent: N1000

16. Ogbo(English sponge)

17. Cotton ball

18. Okpu nwa (baby cap): N500-N1000

19. Baby handkerchief: N700-N1200

20. Baby towel( mkpụrụ abụọ): N3000

21.Baby Flannel( e ji ya ekpuchi nwa): N1500

22. Baby blanket: N5000

23. Baby Flask: N12,000

24. Iko na nkazi nwa : N1000

25.' Glucose : N1500

26. Baby wipe : N1000

27. Diaper @ N6,000x ọnwa 24: N144,000

28. Milton (maka isigbu nje n'ihe nwa): N3500

29. Baby tongue wash: N800

30. 'Baby bottle brush' : N300

31. 'Baby socks' (mkpụrụ asaa): N2500.

32. Ihe eji eku nwa( baby carrier):

33. Mmiri isi ọma e ji asa akwa nwa(Baby Comfort): N 4,000

34. Napkin (otu akpa ya) : N5000

35. Nri nwa x Komkom 36: N144,0000

36 . Akwa nwa na-eto eto@ N5000 maka otu: N100,000