Etu ị ga-esi chekwaa ihe ụmụaka nọ n'ezinaụlọ gị na-eme n'ịntanetị

Ebe foto si, Getty Images
Kemgbe ọrịa Coronavirus malitere n'afọ 2020, o mere ka akpọchie ọtụtụ ụlọakwụkwọ.
Nke a pụtara na ụmụakwụkwọ nọ n'ụlọ jizi ekwentị nakwa ngwa teknụzụ ndị ọzọ dị icheiche na-agụ akwụwkwọ.
Ewezụga agụmakwụkwọ, ụmụaka jikwa ngwa teknụzụ a dị icheiche ekiri ihe onyonyo, egwuregwu, nakwa ịkpa n'etiti ha na ndị enyi ha.
Mana onye ọbụla ma na teknụzụ nwekwara ọghọm dị na ya nwereike ịmetụta ụmụaka n'ụzọ ọjọọ.
Ị ma etu ị ga-esi chekwa ụmụ gị maọbụ ụmụ nwanne gị ndị obere nwere ekwentị na teknụzụ na nsogbu ndị dị n'ịntanetị?
Lee ihe BBC jụpụtara otu ọkachamara n'ihe gbasara ihe metụtara ụmụaka.
Kedụ etu ị ga-esi chekwa ihe ndị ụmụaka na-ekiri?

Ebe foto si, Getty Images
Ọkachamara n'ihe gbasara ụmụaka bụ Maymuna Kadiri kwuru na ụfọdụ ndị okenye nwereike ịtinye anya n'ekwentị nakwa ngwa teknụzụ ụmụaka nọ n'akụkụ gị.
Ọ sị na o nwere ihe ị nwereike itinye iji jịkọọ ekwentị nakwa ngwa teknụzụ nke gị nakwa ụmụaka nọ n'ezinaụlọ gị.
O nwekwara ihe a kpọrọ 'Child Protection' bụ ihe ụfọdụ ekwentị na-etinye iji gbochi ụmụaka ikiri ihe dị njọ n'ịnatentị dịka ịgba ọtọ, ịlụ ọgụ nwere ọbara maọbụ ịgere egwu ndị okenye.
Maymuna sị:
- - Tinye usoro nchekwa ahụ bụ 'Child Protection' n'igwe onyonyo gị. Nke a ga-egbochi ụmụaka ile ihe ndị okenye.
- - Tinye usoro nchekwa ụmụaka ahụ n'akara intanetị gị n'ihe dịka 'Netflix' nakwa 'Youtube'.
- - Ụlọakwụkwọ nyochaa ekwentị nakwa ngwa teknụzụ nke ụmụaka ji agụ akwụkwọ, ọ kachasị ndị bi n'ụlọakwụkwọ.
- - Tinye anya n'ihe ụmụaka nọ gị nso na-eme n'ime abalị, kpachara anya ịhụ na ha ejighi ekwentị ha nabaa ụla.
- - Jiri atụmatụ 'Whatsapp web' banye n'ozi ha na ndị enyi ha na-enwe iji mara ụdịrị ndị bụ enyi ha.
Jiri usoro a jịkọọ ekwentị gị na nke ụmụaka

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọkammụta Maymunah kwuru na afọ nwata kwesịrị iru tupu ọ malite iji ekwentị bụ afọ 13, mana nne na nna ya ga na-etinyere ya anya.
O kwukwara na ọtụtụ ụlọ mgbasaozi ịntanetị na TV nwekwara akụrụngwa ga-egbochi ụmụaka na-erubeghị afọ 13 ilele ihe na-ekwesịghị ka ha lelee.
"Nke bụ eziokwu bụ na kamgbe mfesa ọrịa coronavirus malitere, ụmụaka na-ejikarịzi ekwentị maka agụmakwụkwọ na mmụta, anyị agaghịzi alaghachi azụ n'afọ mgbe ochie, mana ọ dị mkpa ka ụlọakwụkwọ dị icheiche na ndị nne na nna sorokwa na-agbanwe.
Ha kwesịrị ịkpọ ya mkpa, ma na-etinye anya n'etu ụmụ ntakịrị si eji ekwentị eme ihe," Ọkammụta Maymunah kwuru.
Nne na nna na ndị ụlọakwụkwọ kwesịrị ịchọ ndị ọkachamara ka ha kpochaa ma zachaa ekwentị ụmụ ha iji wepụ ihe ọjọọ ha dọturula n'ime ya.
Ụfọdụ ihe ụmụaka na-ekiri, maọbụ na-ege, maọbụ na-agụ, na-ebutere ha nsogbu n'ụbụrụ nke ga-eso ha ma ha na-eto.
Ọkammụta Maymunah kwuru sị: "Ụmụaka ugbua ka anyị mara ihe, ha na-achọ ịmata ihe ọhụrụ kwa ụbọchị. Ha ga-aga na google ma chọta etu ha nwereike isi wepụ ihe i tinyere iji gbochie ha ikiri ihe dị aṅaa n'ịntanetị."
"Oge ụfọdụ, ọ bụrụ na ị chọọ ịnapụ ha ekwentị, ha ga-agba isi akwara, maọbụ wee nnukwu iwe, ha agaghị ekwe ezu ike, mana ọ dị mkpa ka ị kwụdosie ike n'ihe ọbụla i kpebiri ime. Ọ bụghị i mee ya taa, echi ịhapụ ime ya."

Ebe foto si, Iwaria
Etu ị ga-esi tinye ekwentị nwa gị n'ọnọdụ nchekwa
- Tinye afọ ole nwa gị dị ma mpere nwa gị ịmeelụ nke ya
- Tinye teknuzu a na-akpọ Google Family Link n’ekwentị gị dịka onye nne maọbụ nna
- Tinye aha iji mepere nwa gị ịmeelụ n’ime ‘Google family Link’ gị
- Mgbe i mere nke a, a ga-ejịkọ ọba ozi unu abụọ ma zitere gị ozi n’ekwentị gị
- Ụmụ gị ga-enwezị ike were ekwentị ha na-aga ịntanetị etu o siri sọ ha mana ha agaghị enweike wụba ọba ozi na-egozi ọtọ nakwa ihe ndị ọzọ ụmụaka ekwezịghị ịhụ.
Leekwa ihe ndị ọzọ ndị nne na nna kwesịrị ịme iji chekwa ihe ụmụ ha na-ele n’ịntanetị
- Bupụta kọmpụta ụlọ gị ọkachasị nke ụmụ ji abanye ịntanetị n’etiti ụlọ gị iji mara ma na-ahụ ihe ha na-eme oge ọbụla
- Nyere ha aka na achọpụta ihe ha na-achọ n’ịnatentị ekwela ka ha na-achọgharị ihe ebe ahụ sọsọ ha oge ọbụla
- Kpachie ọba ozi niile dị aṅa ịchọghị ka ha banye n’ime ya
- Gba mbọ hụ na ha ji ihe Bekee na-akpọ ‘Password’ gbachie ngwa ozi ha niile nke gụnyere ekwentị na kọmpụta ma gbochie ha ịgwa ndị ọha ya bụ akara password ha
- Gba mbọ hụ na gị na ụmụ gị na-ekwe ọtụtụ nkwukọrịta ma kuziere ha na ọ dịghị ma mmadụ ị na-ezisa ozi ihe dịịrị naanị ya n’ihu ọha
- Gba mbọ mara ihe ụmụ na-eme n’ime abalị dịka ọ bụ oge ahụ ka ha nwereike ịmụ anya ma na-eme ihe ndị dị aṅa.
- Jiri kọmpụta gị ma si n’ụzọ wụba n’ime Whatsapp ha ka ị mara ihe na ndị enyi ha na-akpa.








