Coronavirus tips: Etu ị ga-esi chekwa ụmụ gị ịmerụ ahụ n'oge nnọrọ n'ụlọ a

Nwata kpuchiri anya ya

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos

Ọrịa Coronavirus bụ ebelebe na-egbu n'ọtụtụ mba ụwa niile ugbua.

N'ihi oke ogbugbu si n'ọrịa a pụta, gọọmentị mba dị icheiche gbachiri ụlọakwụkwọ, ụloụka nakwa ọgbakọ ọha mmadụ iji kwụsị mfesa ya.

Nke a pụtara na ezinaụlọ ọbụla na-anọkọtazi ọnụ ụgbua ka ọ bụ oge ezumike.

coronavirus
coronavirus branding

Mana ị ma etu ị ga-esi chekwa ụmụ gị n'ụdịrị oge a?

Anyị na Rejoice Olori na-ahụ maka ahụike ụbụrụ ụmụaka nwere mkparịtaụka.

Ọ kọwara na n'oge a, ndụ ụmụaka dịka ndụ gị agbanweela n'ihi ọnọdụ nọrọ n'ụlọ, nakwa na ọ dị oke mkpa na ndị nne na nna tinyere nke a n'uche ha.

O kwuru na ọ ga-enyere ha aka ị ma ụdịrị agwa ha na-akpaso ụmụaka.

Lee ndụmọdụ ndị o nyere maka nke a

1.Mee ụmụ gị enyi n'oge a

O kwuru na ihe mbụ ndị nne na nna na ndị na-elekota ụmụaka ga-eme bụ ị bịa ha nso

"Ọ bụrụ na ụmụ gị nwee nkwenye n'ebe ị nọ, ọ ga-adịrị ha mfe ị gwa gị uche ha ma ha nwee nsogbu ọbụla" ka o kwuru.

O kọwakwara na nke a ga-enye aka ka ụmụaka gee gị ntị mgbe ị gwara ha okwu.

Nwaanyị na ụmụ ya

Ebe foto si, Getty Images

2.Chọtara ha ihe ha ga na-eme

Ụmụaka nwere ndụ nke ha nakwa ihe ndị ha na-eme tupu ọnọdụ agbanwee

Ị nọ n'ụlọ n'enweghi ihe aka na-eme nwereike ịme ka ha dịba aghara(disorderly)

O kwuru na ị chọtara ha ihe ha ga-eme dịka ị ga ozi n'ụlọ ga-enye aka gbochi nke a.

Ị nwekwarị ịtinye ọtụtụ egwuregwu ezinaụlọ ga na-emekọta ọnụ.

3.Hie asaa n'anya

Ụmụaka na-egwuri egwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Oge a abụghị oge ụmụaka ji apụ igwuri egwu

O kwukwara na oge a bụ oge ụfọdụ ụmụaka ọ kachasị ndị na-abanye ntorobia ga-eji na-agbanwe

N'ọnụ ya "hie asaa n'anya, ị ga-achọpụta ọtụtụ ihe ma ị mee nke a"

Ya bụ tinye anya na ndị enyi ha, ekwentị ha nakwa ụdịrị agwa ha na-egosi mgbe o nweghi onye nọ nso

4.Chọpụta ihe ndị na-atụ ha egwu

Ezinụlọ na-ekiri TV

Ebe foto si, Getty Images

Nke a gbasara ahụike ụbụrụ ụmụ gị, Rejoice kwuru na oge a ga-esi ike maka ụmụaka na-enwe nsogbu ụbụrụ.

Ọ sị gịnwa nne na nna nakwa ndị na-elekọta ụmụaka bịa ha nso ma na-akpalitekwa mmụọ ha maka ihe ọbula nwereike ị na-atụ ha ụjọ.

5.Kọwara ha maka ọrịa Coronavirus

Ụfọdụ ndị nwere ụmụaka pere mpe nwereike ha agaghị aghọta ihe butere mgbanwe na ndụ ha.

"Biko gbanụ mbọ kuziere ụmụ gị maka Coronavirus nakwa etu o si efesa"

O kwukwara ka a gba mbọ hụ na ụmụaka na-akwọ aka ha ma nọrọ n'ụlọ n'apụghị n'ilo egwu egwu.

"Ọ bụrụ na ha chọrọ ka ha na ndị enyi ha nọkọọ, ha kpọọ ha n'ekwentị onyonyo" ka o kwuru.

Rejoice Olori

Ebe foto si, Rejoice Olori

Nkọwa foto, Rejoice Olori, ọkacha mara maka ahụike ụbụrụ ụmụaka.

6.Jie onwe gị ma ị na-agwa ha okwu.

Rejoice kọwara na ụmụaka bụ obere ndị okenye, O kwukwara na ha na-eṅomi agwa ha hụrụ ndị mmadụ na-akpa.

"A gaghị m atụ asị, o siri ike ị bụ nne maọbụ nna ọ kachasị n'izu a mana jiri ndidi na-eso ụmụaka, abanara ha mba"

O kwuru ka ọ ga-akwụsị ha ịtụ gị egwu maọbụ ịnọmi agwa ojọọ.

Na ngwụcha ọ kọwara na ụmụaka niile, n'agbanyeghị afọ ole ha dị ka jiri ihunanya amụta ihe karịa ụjọ.

Ihe ọbụla ị na-eme, jiri ịhụnanya na ndidi na-eso ụmụ gị n'ihi na oge a siri mmadụ niile ike, ọ kachasị hanwa.