Eid-el-Kabir: Ihe ndị ị ga-ejinwu ụbọchị ezumiike abụọ a mee

Ebe foto si, Getty Images/Foodace
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Gọọmentị Naịjiria ekwuola ka ndị mmadụ were ụbọchị abụọ zuru ike maka emume Eid-el-Kabir, mana gịnị ka ị ga-ejinwu ha mee?
Nye ụfọdụ ndị, ụbọchị abụọ ahụ dịkwa ka ụbọchị ọbụla ha na-agaghị ọrụ, mana nye ụfọdụ ndị ọzọ, ọ bụ mgbe ha ga-emeju ihe Bekee kpọrọ Activity afọ.
Mana ị ma na ị ga-emenwu ka ụbọchị abụọ ahụ baara gị uru site n'ime ihe ndị a anyị ga-atụlitere gị elu ugbua:
1) Rahụ ụra

Ebe foto si, Getty Images
N'ezie i nwereike ịjụ ma "isi ọ dịkwa onye dere akụkọ a mma", mana eziokwu bụkwanụ na ezigbo ụra bụ ndụ.
Ọtụtụ ndị anaghị enwetekarị ohere ịrahụ ezigbo ụra n'ihi ihe gụnyere:
- Ụdịrị ọrụ ha na-arụ
- Igbu oge na kpachikpachi njem okporoụzọ nke bụ Traffic na Bekee
- Oke echiche, wdgz.
Mana ihe ọma ị nwereike imere onwe gị n'ime ụbọchị abụọ a gọọmentị ji menyere gị, bụ ịhụ na gị na ụra bụ nwanne mgbe ọbụla ọ tụwara gị, n'ihi na ọ ga-eso n'ihe ndị ị ga-achọ achọ ma sị "a matara m mee" mgbe ị ga-alaghachịkwa ọrụ.
Ọ ga-edozikwanụ gị ahụ ọfụma.
2) Gụọ akwụkwọ

Onye na-agụ akwụkwọ na-emepe ụbụrụ nakwa anya ya ma na-akụziri onwe ya ọtụtụ ihe dị iche iche ga-abara ya uru n'ụwa.
Ịgụ akwụkwọ na-eme ka mgbakasị ahụ nke Bekee na-akpọ "stress" belata nke bụ na ị na-enyekwa onwe gị ezumike ruru gị mgbe ị na-agụ ya.
Ọzọ bụ na onye na-agụ akwụkwọ na-atọ ya ụtọ maọbụ na-akụziri ya ihe anaghị ederu ya ala, nke a ga-enyere gị aka ịkpị "data" dị n'ekwentị gị ị gaara eji agazu ụwa dum na soshal midia.
3) Rie nri

Ebe foto si, Foodace/Instagram
Nwanne nri dị ezigbo mkpa, mana dịka ọnọdụ dị ugbua, ọ dị mkpa iri naanị mgbe ọ gụrụ gị kama ị na-atagharị ọnụ chọm chọm chọm (ọkwa ị chịala ọchị ugbua makana e jidere m gị).
Gbaa mbọ hụkwa na nri ị na-eri bụ nke na-edozi ahụ dịka akwụkwọ nri na mkpụrụosisi.
Gọọmentị enyela gị ikike ịnọ n'ụlọ hapụ ịrụ ọrụ ụbọchị ahụ, ihe ọma ị ga-emere onwe gị bụ iri ihe ọbụla gụrụ gị, etu ọbụla o si gụọ gị.
4) Tụọ ute n'ala soshal midia/zụchaa ego gi

Ebe foto si, Getty Images
Ekwenyere m na m sị gị gụọ akwụkwọ kama ịga soshal midia, mana ọ bụ naanị ụbọchị abụọ a ka i nwere ime ihe ọbụla gbasara gị tupu ọrụ ebidokwa n'ike ọzọ.
Akụkọ asịrị ahụ na-efegharị ị kwere onwe gị nkwa na ị ga-ewetu obi mara ihe butere ya na ihe mechara mee, gaa chọta ya gụzuo ya.
Ọrụ ahụ ị chọrọ itinye akwụkwọ maka ya, nwaanyị maọbụ nwoke ahụ ị chọrọ ịchụta, ugbua bụ ohere gị.
Ego ahụ ị na-akpị kemgbe, were ya zụrụ uwe ọma, akpụkpọụkwụ, akpa, ihe ntecha, na ihe ndị ọzọ na-aba gị n'anya mgbe ị ji ọrụ n'aka.
Ugbua, enweghizi onye ga-asị gị "ngwa wetuo ekwentị gị, apịzịla ya ka ị ghara ịpịwa ya" maọbụ "ọkwa ị hapụla ọrụ ị na-arụ pịwa ekwentị".
5)Gwuo egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ gị na ụmụaka bi n'ime ụlọ maọbụ n'agbataobi? I nwere ohere imenye ha obi aṅụrị.
Bụrụ nne, nna, deede maọbụ daada nke a ga-eji ime obi aṅụrị mara site na iji egwuregwu debanye aha gị n'obi ụmụaka ndị a.
Kuziere ha etu e si esi nri, eghe ihe n'ekwu ọkụ, etu e si ese ihe, etu e si agba egwu, kọọrọ ha akụkọ ifo, gụọrọ ha egwu ọnwa dgz.
Ị nwekwara ike ịkpọkọta ha ọnụ gụọrọ ha akwụkwọ na-atụ ụtọ, na-agbanwe olu gị ka ị na-agụ ya. Ha agaghị echefu nke a echefu.
6) Lee ma ị ga-amụtanwu otu akaọrụ
Nke a abụghị iwu o, mana ọ ga-abụ ihe dị mma nyere gị ma ọ bụrụ na ị ji ohere ndị ị nwere wee mụta otu ihe maọbụ abụọ ị na-amabughi eme mbụ.
Nwanne m nwoke/nwaanyị, ọ bụrụ nri ka ị maghị esi, I nwaa ya ugboro abụọ atọ maọbụ anọ n'oge a I nwere ohere, I ga-amụta ya o bụrụgodi obere (nwanne agbakwala ụlọ ọkụ oo).
Ọ bụrụ ịdụchi akwa dọkara adọka were nkịkara akwa mụwa ya ị ga-amụta ya.
Ị maghị akpa isi mana e nwere ndị bu ntutu ebe ị nọ? Rịọ ha ka ị jiri ohere a mụta etu e si eme ya.











