Lock Down in Nigeria: Gbanahụ oke ibu, 'afọ beer' site n'iri nri ndị a n'oge a

Osikapa nke imeobodo

Ebe foto si, Food Ace

Ị na-atụ ụjọ ibu oke ibu maọbụ inwe 'afọ beer' n'ihi ọnọdụ nọrọ n'ụlọ nke gọọmenti manyere onye ọbụla ruo?

Nwanne bute oche ka ị gụọ ihe nwada Igbo a bụ ọkammụta gbasara nrị na ihe o na-enye n'ahụ kpọpụtara dịka nri ị nwereike iri wee gbanahụ ọrịa ịnọ otu ebe na-ebute

Nọọsụ Adanna Monday kwuru na ugbua ohere ịnọ n'ụlọ dapụtara, ọ dị mkpa ka onye ọbụla jiri aka ya na-esi nri ya ugbua.

O kwukwara na mmadụ kwesiri ị na-ahazị oke nri ọ na-eri kwa mgbe.

N'okwu ya, "iri ezigbo nri ga-eme ka ọrịa dịka oke ibu, ọbara mgbali elu, diabetes, gbaara mmadụ ọsọ."

Lee nri ise okenye na ụmụaka ga-eri ka ha chụpụ ọrịa niile na-abịa ma mmadụ na anọkarị otu ebe

1.Mkpụrụ osisi

Mkpuruosisi

Ebe foto si, Getty Images

Nọọsụ Adanna kwuru na irikarị mkpụrụ osisi ga-eme ka ọrịa ịnọ otu gbalaga.

Ụfọdụ mkpuru osisi ọ gụputara gụnyere orọma, 'lemon', 'strawberry', na mango bu ezigbo vitamin C ebe water melon ga-enye gị ezigbo mmiri n'ahụ.

Apple bụkwa mkpụrụosisi ga-enye gị nnukwu "Fibre" ga-edozi ahụ gị.

2. Akwụkwọ nri

Akwụkwọ nri

Ebe foto si, Getty Images

Riwe ụgụ na spinach ọfụma maka na 'green' ha tọrọ atọ dịka dọkịta Adanna si kwuo.

Nke a ga-enye gị ihe ndị nwereike iluso nje agha n'ahụ gị.

3. Anụ ọcha

Anụ ọkụkọ

Ebe foto si, Getty Images

Ọ na-abụ ịhụ anụ ehi ahụ a na-ama gị jiji? Biko ọ bụghị maka oge a.

Nọọsụ Adanna kwuru na anụ dịka azụ ọcha(crocker maọbụ tilapia), anụ ọkụkọ maọbụ anụ 'turkey' na ka mma n'oge a maka ịgbanahụ ọrịa.

Nke a ga-eme ka ahụ gị ghara ị na-anyị gị arụ mgbe niile.

4. Kabọhidreti pụrụ iche

Osikapa nke imeobodo

Ebe foto si, Food Ace

Dọkịta Adanna gụpụtara nri a dịka osikapa ọfada , osikapa nke si n'ubi ghara ịgabiga ọtụtụ mgbanwe.

Ọ gụnyere beans, potato na legume niile makana ha ga-eme ka ịghara ị na-ata cham cham.

5 Nri bu fati na-edozi ahụ

Ube oyibo

Ebe foto si, Getty Images

Nri ndị a bụ nọtụ, salmon, olive oil, Mackerel na ube oyibo.

O kwuru na nri ndị a na-edozi obi mmadụ mana ọ ga-adị mma ka mmadụ ghara iribi ga ya oke maka ibu, tụmadị ọ bụrụ na ị na-agbara ibu ọsọ.

Nke a bụ makana ha bu ibu karịa protein na kabọhidret.

Mmiri ọnụnụ

Ebe foto si, Getty Images

N'ikpeazu, dọkịta Adanna kwuru ka ndị mmadụ na-aṅụ mmiri ọfụma n'oge a.

Ọ bụrụ na o kweghị gị, gote mkpuru osisi juputere na mmiri dịka 'water melon' tawa.

coronavirus
coronavirus branding