Enugu state: Kọmishọna ahụike n'Enugwu anwụọla

Prof. Anthony Ugochukwu

Ebe foto si, Amoke Louis

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ọnwụ egbuola onye bụbu kọmishọna ahụike n'Enugwu steeti bụ Ọkammụta Anthony Ugochukwu n'abalị Fraịde.

Ugochukwu bụ onye asị na ọ nọ n'akwa ọrịa kemgbe bụ akụrụ (Kidney) ya gharịpụrụ.

Onye gbara ama a bụ ọdeakwụkwọ gbasa ozi steeti ahụ bụ Amoke Louis dere ya n'akara Twitter ya taa bụ Satọde.

Amoke sị na nke a dị na akwụkwọ Kingsley Ugochukwu tinyere aka n'aha ezinaụlọ ha.

Akụkọ anyị nụrụ na-ekwu na ọteela Ugbochukwu rịawara ya bụ ọrịa nke mere o ji gaa ala Bekee maka ọgwụgwọ na ọnweghị isi.

Aka ndị uweoji akparala ndị oshi n'Anambra steeti

Ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ sị na mmadụ atọ ahụ asaalarị asịsa tinyere egbe na mma ahụrụ ha n'aka.

Ụmụibe ka ọ dị ugbua anụ ahụ na-enweghị aka maọbụ ọkpa akpọro coronavirus egbuola mmadụ karịrị puku iri isii n'ụwa gbaa gburugburu.

Nwanyị na-eru uju maka nwa ya nwụrụ

Nwaanyí na-ebe akwa

Ebe foto si, Reuters

Maka ndị chere na coronavirus anaghị egbu ụmụaka, geenụ ntị.

Nwatakịrị gbara afọ ise esorola n'ọnụọgụ ndị ya bụ ọrịa gburu na UK dịka National Health Services nke mba ahụ siri kwuo.

Tokyo Olympic

Ndí ntórobía

Ebe foto si, Getty Images

N'egwuregwu, atụrụ anya na otu na achịkọta asọmpi egwuregwu na mbaụwa bụ Fifa ga-ahụpụ ụmụnwoke gbara afọ iri abụọ na anọ n'afọ ọzọ ka ha soro gbaa asọmpi Tokyo Olympic enyigharịri afọ 2021 maka coronavirus.

Cheta na asọmpi ahụ kwesịrị ịbụ maka ndị na-akarịghị afọ iri abụọ na atọ, tinyere mmadụ atọ ọzọ bụ ndị katụ ha.

Ejidela otu onye gbapụrụ n'ụlọ nchekwa

Ebe ndopu

Ebe foto si, Lagos State Government

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na gọọmenti Osun steeti ejidela nwaamadị ahụ sị n'ụlọ nchekwa ebe ana edowe ndị bụ nje coronavirus gbapụ n'ụtụtụ taa.

Kọmishọna mgbasa ozi steeti ahụ bụ Funke Egbemode kwuru na ọ bụ otu onye si ebe ahụ gbapụ na ọ bụghị mmadụ abụọ dị ka ekwuburu na mbụ.

Mana ugbua, ejidele ya bụ onye.

Egbemode kwuru na ha ga-aga na bee ndị ahụ ga-achọgodu ha n'ihi na ha ma bee ndị ahụ.

5G in Nigeria: Ihe mere ndị mmadụ ji adọkasị onwe ha na social midịa

Teknụzụ ekwentị 5G network

Otụtụ ndị mmadụ nọ n'elu soshal midia na-ekwu na ha agaghị anabata 5G na Naịjiria.

Ụfọdụ sị na ya bụ 5G bụ ya na-ebute ọrịa coronavirus.

Ebe ụfọdụ kwuru na akụkọ ahụ bụ akụkọ ifo.

Mana dibia bekee akpọrọ Mcginger Ibeneme ekwuola na onweghị ihe o chere jịkọtara ọrịa coronavirus na 5G.

O kwuru ka ụmụ Naịjirịa gbado anya n'ime ntuziaka e nyere gbasara mgbochị nfesa ọrịa coronavirus karịa ma ị na-ekwu ihe ha amaghị.

Mcginger kwuru na ọ bụ ọrụ ndị sayensi inyocha mara etu ya bụ 5G si metụta gburugburu ndị mmadụ bi.

Lee ụfọdụ ụmụ Naịjirịa na-ekwu na soshal midia

@realFFK so na ndị bu okwu a a na-eche ọ bụ ụgha n'isi.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@ayemojubar kwuru na 5G ka bupute 'radiation' nwereike imebi ahụ mmadụ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@iSlimfit kwuru na ọ ka na-agbagọjụ ya etu ndị mmadụ si kweta na akụkọ ụgha na-ekwu na 5G na-ebute ọrịa coronavirus.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Yahaya Bello sị na Kọmishọna tiri nwaanyị ihe ga-anụ ụda ya

Yahaya Bello

Ebe foto si, Yahaya Bello Media Centre

Nkọwa foto, Gọvanọ Yahaya Bello gbarụru ihu maka kọmishọna tiru nwaanyị ihe

Gọvanọ Yahaya Bello nke Kogi steeti arịọla ndị mmadụ ka ha dere jụụ maka ebubo otiti ihe na akwamiko n'ike ana ebo otu kọmishọna ya.

Bello si na ya ehibela kọmiti ga-elebe anya na ya bụ ebubo ma kwee nkwa na ndị aka ha dị na ya ga-ata ezigbo ahụ ma ikpe maa ha.

Kameron na Coronavirus

Paul Biya nke Kameron

Ebe foto si, Getty Images

N'Afrịka, onye ndụ ndị patị anọghị na ọchịchị bụ Maurice Kamto akatọọla agwa onyeisiala Camerun bụ Paul Biya maka nkịtị ọ gbara ka ọnụọgụ ndị bụ coronavirus na-arị elu na mba ahụ.

Biya ekwubeghị okwụ gbasara ọrịa ahụ kemgbe ọnụọgụ ndị bu ya ọrịa karigoro narị ise na mba ahụ.

Akpịrị Ighalo ka dị na Manchester United

Odion Ighalo

Ebe foto si, Getty Images

N'egwuregwu, nwafọ Naịjirịa bụ Odion Ighalo ekwuola na ọ bụrụ na Manchester United gbatikwuo nkwekọrịta ọrụ ya na ha, na ọ ga-amasị ya ịnọtukwu ebe ahụ.

Ighalo kwuru nke a n'akara Twitter ya mgbe otu onye nkwado ya juru ya ya bụ ajụjụ.

Ndị nkwado Ighalo na-aja ya ike na Twitter maka ịso ndị nkwado ya akpa nkata na ya bụ ọba nzikọrịta ozi.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Mba Nijee na ndị omekome

Ndí agha

Ebe foto si, AFP

N'ebe ọzọ n'Afrịka, dịka coronavirus na-egbu ndị mmadụ, ndị agha mba Nije asụọla ndị omekome akwụ n'okeala ha na Mali.

Gọọmenti mba ahụ kwuru na ha gburu mmadị iri isii ndị ekperima ahụ ebe ndị agha ha anọ nara n'agha ahụ.

Gee akụkọ ndị a na ndị ọzọ n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị