Cronavirus: Lee mba ndị COVID-19 echetabeghi

Ndị na-akwọcha aka

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ịkwọcha aka bụ ụzọ kacha dị ire iji gbochie ọrịa coronavirus

Ọrịa coronavirus nke a na-akpọ COVID-19 na-eme njem na-agagharị mbaụwa dị icheiche mana ị ma na e nwere ebe ndị ọ tụbeghị ụkwụ ruo ugbua?

Ọrịa a batara Naịjiria n'ime izu ole na ole gara aga, egbuola ihe karịrị mmadụ puku 50 kemgbe o selitere isi na mba Chaịna n'ọnwa Jenụwarị 2020.

Ka ọ dị ugbua, ihe ruru mmadụ otu nde ebutela ya bụ ọrịa na mbaụwa, ebe ihe karịrị mmadụ puku narị abụọ gbakerela.

Mana ị makwa nke ekwe na-akụ nwanne?

coronavirus
coronavirus branding

Ruo taa bụ abalị atọ nke ọnwa Eprelụ, e nwere mba ndị ejibeghi anya hụ kama otu onye bu ọrịa a.

Ị na-ajụ mba ndị ọ bụ? Ngwa lee ka anyị kọwaara gị:

Dịka BBC si chọpụta na ngụkọ mahadum Johns Hopkins mere, mba 18 n'ime mba 193 so n'otu mbaụwa bụ United Nations enwebeghi otu mkpụrụ onye bu ya bụ ọrịa.

Mba ndị na-ebughi COVID-19:

North Korea

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Anụbeghi akụkọ coronavirus na mba Nọt Koria, ihe a na-anụ ịtụ ogbunigwe 'nuclear'
  • Komoros
  • Kiribati
  • Lesotho
  • Mashall Aịlandị
  • Maịkroneshia
  • Nauru
  • Nọt Koriya
  • Palau
  • Samoa
  • Sao Tome na Principe
  • Solomon Aịlandị
  • Saụt Sudan
  • Tajikistan
  • Tonga
  • Tọkmenistan
  • Tuvalu
  • Vanuatu
  • Yemen
Mmadụ abụọ nọ n'elu ọgbatumtum n'obodo Aiwa dị na mba Nauru

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A na-atụ egwu na coronavirus ga-anyụ mba Nauru anya ma ọ baa ebe ahụ, n'ihi na ha bụ mba dara ụbịam.

Ụfọdụ ndị ọkachamara na-akọwa na o nwereike ịbụ na mba ndị a akpọpụtabeghi ọnụọgụgụ ndị bu ya; na ọ bụghị na enwebeghi ndị butere ya.

Ndị ọzọ, ọkachasị ndị a bụ mba ndị nọ n'elu mmiri a na-akpọ aịlandị, nwereike ha ebutebeghi ya n'ihi na ha anaghị enwekarị ndị si esi abata mba ha (bụ etu ọtụtụ ndị mba ọrịa a na-enye nsogbu ugbua a si bute ya).

Ụfọdụ mba ndị ahụ tere ezigbo aka nke bụ na mmadụ ga-eme oke njem tupu o rute ebe ahụ.

Ihe dịka mba Nauru, machiri mba Chaịna, Saụt Koriya, Itali na Ịran ịbata na mba ha ka ọrịa a malitere.

Ha kwụsịkwara ụfodụ ụgbọelu si mba ndị ọzọ ifetu na mba ha, dịka onyeisiala mba ha sịkwa na o ji ekpere na akwụkwọ nsọ echekwa mba ya.

Ọrịa a ọ ga-emecha ruo ha aka?

Aha onyonyo, Akpụrụachịa anaghị achụ coronavirus

Ndị ọkachamara na-ekwu na mmachi na mgbochi ha na-eme nwereike na-azọ ha ugbua, mana o nwereike ghara ịdịgịde.

Maka gịnị? Andy Tatem, bụ ọkammụta sayensị na mahadum Southampton, kwuru na mba ndị a na-atụbatakwa ihe dịka nri na ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka.

Nke bụ na e gbochigide, oge ga-erukwa mgbe ha ga-achọ ịtụbata nri maọbụ ihe ndị ahụ maọbụ ibupu nke si mba ha.

Mgbe ahụ ha ga-emepe okeala ha makwa bulie ụfọdụ mmachi a nke ga-eme ka ọrịa a nwee ohere ịmịbata.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Anyanwụ anaghị agwọ coronavirus