Coronavirus: Ozi ọma maka coronavirus
Ọbụghị naanị akụkọ ọjọọ ka e kwesịrị ịgbasa banyere ọrịa coronavirus. E nwekara akụkọ ọma.
Kamgbe ọrịa coronavirus malitere kpawa ike, a nụla ọtụtụ akụkọ ọjọọ gbasara ya n'akụkụ ụwa niile.
Akụkọ etu coronavirus si egbu puku kwuru puku mmadụ abụghịzi ihe ọhụrụ.
N'ụbọchị Mọnde, ọrịa a gbukwara otu onye na Naịjirịa.
Ma lee akụkọ ndị na-enye obi aṅụrị gbasara ọrịa a.
Akụkọ ndị a gosiri na olileanya dị.


