Coronavirus Vaccine: E nwetela ọgwụ e ji agwọ coronavirus na Naịjirịa?

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ mmadụ na soshal midia na Naịjịrịa nakwa ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ na-ekesa akụkọ na-ekwu na o nwere ọkammụta chopụtara ọgwụ na-agwọ nje coronavirus.
Ọkammụta ahụ bụ Maduike Ezeibe bụ onye na-akuzi nkuzi na mahadum ọrụ ugbo Michael Okpara dị na Umudike.
Ọkammuta Ezeibe, dịka akụkọ siri kwuo, sị na ọgwụ ya ga-enye aka n'ịgwọ ịba Lassa na Coronavirus.
Ka a ka na-atule akụkọ a, Ọkammụta Maurice Iwu bụ onye bụbu onyeisi ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa kpọrọ ndị ntaakụkọ oku wee si na ya nwere ọgwụ olemole ya na-enyocha maka ọgwụgwọ nje a.
Akụkọ ndị ọzọ maka ọgwụ coronavirus
Tupu ndị a ekwuo na ha nwere ihe nwereike ịrụ ọrụ n'ịgwọ coronavirus, o nwekwara ndị ọzọ wuru ewu.
Otu akụkọ si Chaina kwuru na a choputara na ọgwụ ejibu agwọ ịba na Naịjirịa na ọtụtụ mba a kpọrọ chloroquine na-ere dịka ọgwụ nje choronavirus.
Ndị ọkammụta na sayensi ekwubeghị na nke a bụ eziokwu.
Ọzọkwa bụ ụfọdụ ndị ntaakụkọ na-ede na ndị sayensị na maba Izrel nọ n'ụzọ ịchọpụta ọgwụ nje a.
Kedụ ihe ndị na-ahụ maka ahụike na-ekwu maka okwu ndị a?
Ngalaba na-ahụ maka ahụike n'ụwa a kpọrọ "World Health Organisation" (WHO) dere na webụsaịti ha na enwebeghi ọgwụ coronavirus ugbua.
WHO sị na-enweghị ọgwụ ọbụla nwereike gbochie nje a kama na ndị butere ya kwesiri inwete ọgwụgwọ ga-enyere ha aka maka mpụtara ya bụ ọrịa na-ahụ ha.
Dịka WHO - so na ndị ejechaa ọgwụ n'ihe banyere ọdịmma mba ụwa - siri kwuo ọ bụ mgbochi bu ihe a ma dịka ihe ga-enyere mmadu aka n'ebe ọrịa dị.
Anthony Fauci bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọrịa na mba Amerịka a kpọrọ "National Institute of Allergy and Infectious Diseases" sị na ọ ga-eru otu afọ tupu ewepụta ọgwụ ọrịa coronavirus.
Ọ sị, "Ọgwụ e mere ma bido na-enyocha n'ime otu afọ abụghị ihe a ga-ekesa ndị mmadụ."
Okwu ya a bụ maka na a na-enyocha etu ọgwụ ga-adị mmadụ na-ahụ site n'ihe Bekee kpọrọ "clinical trials".
Usoro eji emepụta ọgwụ

Ebe foto si, Getty Images
Ọgwụ ọhụrụ ọbụla ga-agabiga nyocha na nwale tupu ndị dọkịta amalite inye ya ndị mmadụ maka ọgwụgwọ ọrịa.
A na-eme nnyocha ọgwu ahụ maka:
- Ị mata ma ọ bụ ihe mmadụ ga-erinwu
- Ma ọ na-arụ ihe a sị na ọ na-arụ
- Otu e si aṅụ ya
E nwere ụzọ atọ eji enyocha ọgwụ:
1)A ga-eji ihe Bekee kpọrọ "computer models" na anụ ahu eji ihe Bekee kpọrọ 'human skins cells" mee nyocha ọgwụ
Usoro a ga-enye aka ka a mata etu ọgwu ahụ ga-esi nye mmadụ nsogbu
Ọtụtụ ihe eji chọọ ime ọgwụ na-ada nyocha a maka na ha na-emebi anụ ahụ
2) A ga-eji anụmanụ dị ka oke ọcha nwaa ọgwụ gafere nyocha nke mbụ ahụ. A ga-elele etu ya bu ọgwụ di na-ahu ya bụ anụmanụ
3) Ọgwụ gafere nyochaa e ji anụmanụ mee ga-agazị n'ihu ma bụrụ ihe a ga-enyocha na-ahụ mmadụ
Ndi e ji eme nyocha bụ ndị na-arịa ọrịa a chọrọ iji ọgwụ a gwọo
4) Site ebe a, a ga-enyezi ikike ka a malite inye ọha ya bu ọgwụ.
Enwere ihe ọzọ eji agwọ coronavirus

Ebe foto si, FAAN_official
Ọkanmụta Osibogun, bụ onye ọkachamara n'ihe banyere nje na ụlọọgwụ mahadum Legọs, sị na ọtụtụ ihe ndi mmadụ na-ekwu na-eji agwọ nje a dịka mmanya ọkụ na ofe ose abụghị ihe sayensi kwadoro.
Osibogun sị," Oke ofe ose na mmanya bụ inyere ndi na-ere ahịa aka ire ahịa ha ọfụma maka na amaghị ha ka ihe eji agwo ọrịa."
Ọ sịkwa ka agbadogodi ụkwụ maka okwu Chloroquine, nke o sị na ndị WHO ekwubeghi na ọ ga-ere.
"Ndị mmadụ na-anwa ọtụtụ ihe mana ọ ga-eru ọnwa isii tupu a mata ihe ga-arụ ọrụ."
Kedụ ihe Ọkammuta Ezeibe na-ekwu?
BBC Kpọrọ Ọkammụta Ezeibe ka ajụta ya ma nchopụta ya o gara n'uzoro anyi dere n'elu mana ọ sị na ya no n'ụzọ ka akọghachie ya.













