Coronavirus: Ihe dị mkpa gọọmentị Naịjirịa na-eme ịgbochi ọrịa a

Ndị Naịjirịa si njem lata

Ebe foto si, Getty Images

Coronavirus bụ ọrịa ọhụrụ si na akụkụ Wuhan na mba Chaịna pụta egbuola mmadụ 170.

Ka ọ dị ugbua, ọrịa ahụ eferela rue mba iri na isii ma jide kwa mmadụ 7711 na mba ụwa niile.

E chere na o rutela mba Afrịka mana nwata akwụkwọ e chere na ọ nwere ya na mba Ivory Coast enweghi ya.

Naịjirịa bụ ebe ọtụtụ ndị mba Chaịna na-abịa a zụ ahịa ya mere anyị ji jụọ "Gịnị ka gọọmentị Naịjirịa na-eme ijji gbochi ọrịa a"

"Gbajọgodinu ụzọ Chaịna n'oge a"

Minista na-ahụ maka ahụike bụ Osagie Enahire agwaala ndị Naịjirịa ha kwụsịtụ njem mba Chaịna ugbua

N'ọnụ ya "ọ dịla mkpa ịgwa ndị Naịjirịa ha hapụ ị ga Chaịna sọsọ maọbụ okwu dị oke mkpa".

Nyocha ọdọụgbọelu dị icheiche

Ndị Naịjirịa si njem lata

Ebe foto si, Getty Images

Ihe ọzọ Enahire kwuru bụ na ebidola nyocha pụrụiche n'ọdọụgboelu ofesi niile dị na Naịjirịa.

Ha gụnyere Abuja, Kano, Porthacourt, Enugu nakwa nke dị na Legọs.

Ha kwuru na ha ahaziela ogige ebe ha ga-edobe ndị a chọpụtara na ha bu ọrịa ahụ maka nyocha.

Njikọ aka maka ọdịnma ahụike ndị mmadụ

Abike Dabiri-Erewa

Ebe foto si, @abikedabiri

Nkọwa foto, Abike Dabiri-Erewa bu onyeisi ngalaba gọọmentị na-ahụ maka ndị Naịjirịa nọ n'ofesi

Ngalaba na-enyocha ọrịa na-efe efe bụ NCDC n'aha ịchafụ ekwuola na ha na WHO ejikọla aka maka ịluso ọrịa ọgụ.

Cheta na WHO ekwubuola na ọrịa nwereike ifesa mbaụwa niile nke ha kpọrọ "Epidemic outbreak" na Bekee.

Ebe Onyeisi Nigeria Diasposara Commision bụ Abike Dabiri kwukwara na onweghi onye Naịjirịa buterela ọrịa a na Chaịna.

Coronavirus

O kwukwara na ụfọdụ ụmụakwụkwọ agaala n'ụlọọrụ Naịjirịa dị na Chaịna.

"Anyị na Ministri na-ahụ maka ndị ofesi ejikọọla aka ịma etu anyị ga-esi kpọpụta ndị tọrọ ebe ahụ" ka o kwuru.

Mana, otu nwata akwụkwo ya na BBC Igbo kpara nkata sị na onwebeghị onye ha hụrụ ma kwuo na ọ bụ agụ bụ isiokwu ha ugbua.

Coronavirus

"Ndị Gana izitaala ha ego mgbachi akpa, mana anya anyị ahụbeghị ndi nke anyị."

Ọ gwakara n'ihu dụọ ndị Naịjirịa na-abịa Chaịna ọdụ maka nke a ma sị ka ha ghara ịbịa Chaịna ruo oge nje a lala.