China Coronavirus: Anyị ebidola inyocha ndị njem - FAAN

Ọdọụgbọelu

Ebe foto si, @FAAN_official

Nkọwa foto, FAAN na-eme nyocha ahụ iji wee hụ na ha gbochiri ọrịa coronavirus ịbata Naịjirịa
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naijiria bụ 'Federal Airports Authority of Nigeria' (FAAN) arịọla ụmụ Naijiria na-eme njem ka ha rube isi ma nye ohere maka inyocha ha ahụ.

Nke a na-eme dịka ajọ ọrịa Coronarvirus dapụtara na China, gbuo mmadụ iri abụọ na ise ma jituo ihe karịrị mmadụ 300.

Ọrịa ahụ efesakwaala ruo mba Japan,Thailand, Singapore nakwa South Korea.

N'akwụkwọ ozi ya, ọnụ na-ekwuru FAAN bụ Henrietta Yakubu kwuru na ụlọrụ ahụ na ngalaba na-ahụ maka ahụike agbaala mbọ iji hụ na ngwa ọrụ dị mkpa iji gbochie ọrịa ahụ zuru oke n'ọdọụgbọelu.

O kwuru sị: "Ngwa ọrụ nile na ndị ọrụ ndị nyere aka na ịkwụsị ọrịa ebola n'afọ 2014 ka dịkwa n'ọdọụgbọelụ anyị."

Atụmatụ ọhụrụ ndị FAAN wepụtara maka etu ndị mmadụ ga na-efegharị

Ka ọ dị ugbua, ọrịa coronavirụs emeela ka e mechie obodo mepere emepe atọ na China; Wuhan, Ezhou na Huanggang .

Obodo Beijing kwụsịkwara mmemme niile ha chọpuburu ime n'ihi ya bụ ọrịa.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

'Lassa Fever' ka na-akpa ike

Iba Lasa aribatala n'Enugwu steeti.

Onye ntaakụkọ BBC gara ụlọọgwụ Parklane ebe ndị ọrụ nọ na gbagharia dịka orịa lassa Fever gburu otu nwaanyị gbara afọ iri asaa na ise ebe ahụ.

Ka ọ dị ugbua, enwetela mkpesa Lassa fever na Ondo,Abia, Delta na Kano steeti.

ọrịa a egbuola dọkinta abụọ na nwaanyị dị ime na Kano, mmadụ iri na isii na Ondo steeti, otu nwoke n'Abia steeti.

Mmachị obodo Wuhan nke dị na China

Mba China
Nkọwa foto, Nje Corona egbuola mmadụ iri na asaa na mba China

Ka akụkọ nje na ọrịa na-aga n'ihu, ndị mba China amachiela mbata ma ọ bụ ọpụpụ na obodo Wuhan maka nje Corona nke na-egbu ndị mmadụ ka ọrịa SARS.

Nyocha na egosi na ọ bụ na Wuhan ka ya bụ nje siri bido site na-ire anụ ọhia. Mmadụ iri na asaa anwụọla ebe ihe dịka mmadụ narị ise na iri asaa bụ ya bụ ọria ma otutu ha bị na Wuhan.

Ọkụ Ọstrelịa

Ọkụ Ọstrelịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọkụ a egbuola otutu mmadụ ma mebie kwa ihe

Mmadụ atọ anwụọla dịka ụgbọelu eji emenyu ọku dara na mba Ọstrelịa.

Mmadụ atọ a bụ ndị mba Amerịka sọ na mmadụ iri ato na atọ nwurula maka ọku a bidoro gbawa kamgbe ọnwa Seputemba 2019.

Dịka ọ dị ụgbụa, amabeghị ihe mere ka ya bụ ụgbọelu daa.

Ọdọụgbọelu

Ebe foto si, @FAAN_official

Nkọwa foto, FAAN na-eme nyocha ahụ iji wee hụ na ha gbochiri ọrịa coronavirus ịbata Naịjirịa