Lassa Fever outbreak: Ịba Lassa egbuola onye nke abụọ n'Enugwu

- Onye dere ya, Ebere Ekeopara
- Ndị mere akụkọ a, Reporter, Igbo Service
Iba Lassa egbuola onye nke abụọ nke ọrịa ahụ jidere Enugwu steeti.
Nwata nwaanyị ahụ gbara afọ 24 nwụrụ n' ụlọgwụ 'UNTH' Enugwu.
'Permanent Secretary' Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike n'Enugwu steeti bụ Dọkịnta Ifeanyi Agujiobi gwara onye ntakụkọ anyị bụ Ebere Ekeọpara na nwaanyị ahụ gbara afọ 24 nwụrụ ka o mechara awa ole ma ole ebutere ya n'UNTH Ituku Ozalla.
O kwukwara na e liela ozu nwaanyị ahụ n'obodo ya tata bụ Fraide.
N'otu aka ahụ, onyeisi ụlọọgwụ UNTH bụ Dọkịta Obinna Onodugo kwuru na amalitela ịchọ ndị ya na nwaanyị ahụ nwụrụ metụkọtara iji gbochie ya bụ ọrịa ifesa n'etiti ndị ọrụ ụlọọgwụ ha nakwa ụlọozu.
Onodugo gbara ama na ha nwere ọgwụ maka ndị o metụtara ma dụọ ndọ ọrịke ka ha kee nckwụcha igbochie inweta ọrịa ahụ site na nkwado kwesịrị.
Nke a mere ya mmadụ atọ butelera ọrịa Lassa n'Enugwu.
Mmadụ abụọ n'ime ha anwụọla, ebe onye nke atọ nọzị n' ụlọ ọgwụ Lassa dị n'Abakaliki ebe ọ na- anara ọgwụgwọ.
Otu onye ọzọ eburula ọrịa Lassa Fever n'Enugwu

Nwagbọghọ gbara afọ 23 abụrụla onye nke abụọ buterela ọrịa Lassa Fever n'Enugwu steeti.
Odeakwụkwọ mịnịstrị ahụike na steeti ahụ bụ Ifeanyi Agujiobi gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo nke n'Enugwu.
Ọ kọwara na nwagbọghọ ahụ bụ onye nkuzi Nsukka malitere rịawa ọrịa, nke ndị ụlọọgwụ ji mịrị ọbara ya ga mee nyocha n'Abakaliki.
Nyocha e mere gosiri na ọ bụ ọria lassa fever na-arịa nwa agbọghọ ahụ.
Agujiobi sị na e burula ya gawa n'ụlọọgwụ lassa fever dị n'Abakaliki, Ebonyi Steeti, ebe ọ nọ na anara ọgwụ ugbua.

N'ịza ajụjụ ọnọdụ ndị ọrụ ahụike ahụ metụrụ Christiana Ugwuoko nwụrụ n'ọrịa a ahụ, Agujuobi kwuru na ọ bụ ndị ọrụ ahụike Park lane Enugwu mmadụ 174 ka a na enyocha ugbua.
O kwuru na onweghi onye ọrụ ahụike nwere ọrịa a mana e nyere ụfọdụ n'ime ha a kpọrọ 'Category 3' ụbọchị 21 ka ha ga zuo ike, ka e were lee ma ọrịa ọ ga ebido ha.
Iji chekwaba ndụ ndị mmadụ wee hụ na ya bụ ọrịa ogbugbu agbasaghị Gọọmenti Enugwu ewerela aka ha lie ozu nwaanyị nwụrụ n'ọrịa Lassa n'Enugu.
E liri ahụ nwaanyị ahụ na be ya bụ Amọji Nike, Enugwu.
Gọọmenti agaala n'ihu inyocha ndị ezi na ụlọ nwaanyị ahụ iji mata ma onwere onye bu ọrịa ahụ.
Perm Sec Mịnịstrị ahụike bụ Dr Ifeanyi Agujiobi kwuru nke a n'Enugwu.
Dịka nke a na-eme, egwu ji ndị ọrụ ụlọgwụ ahụ dịka ha na-atụ nje n'ụfọdụ ha nwere ike inweta nje ọrịa ahụ dịka nwaanyị ahụ nwụụ nọrọ ihe karịrị otu izụka tupu amata ihe na-eme ya.
Ọrịa Lassa abaala Enugwu steeti

Akụkọ pụtara ụbọchị Wenezde kwuru na otu onye nwụrụ maka Ịba Lassa n'Enugwu.
Onye ntaakụkọ BBC gara n'ụlọgwu Parklane dị na GRA, Enugwu ụbọchị Wenezde kwuru na ụlọọgwụ ahụ nọ na katakata ugbua dịka ọrịa 'Lassa fever' gburu otu nwaanyi achọghị ịkpọ aha ya.
O kwuru na ndịọrụ ahụike ka nọ na mgbagharị ebe ndị ọrụ nchekwa na-agba ọgwụ n'ụgbọala niile dị n'ogige ụlọọgwụ ahụ nakwa na gburugburu ya.

Otu Dokita na-achọghị ka a kpọọ aha ya kọwaara BBC na ya bụ nwaanyị bụ Christiana Ugwuoko gbara afọ iri asaa na ise bụ onye Amọji Nike dị n'Enugwu steeti.
Dọkita ahụ gwara anyị na ya bụ nwaanyị anọọla ihe dịka otu izu ụka na ngalaba gbatagbata (emergency ward) nke ụlọọgwụ ahụ tupu ebubata ya na ICU.
Ọbụzị na ICU ahụ ka ha bidoro nyowe ihe na eme ya bụ nwaanyị enyo.

Ha wee mịrị ọbara ya ziga n'Abakaliki ebe a na enyocha Lassa fever nke ọma, tupu ya bụ nyocha Lab alọta, ya bụ nwaanyị anwụọla.
Onye ntakụkọ anyị gbakwara ama na e jichiela ndị dọkịta na ndị ọrụ ahụike metụrụ nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ ahụ maka nnyocha nakwa ịhụ na ọrịa ahụ efesaghị.
Dịka onye isi mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Dọkịta Ifeanyị Agụjiobi si kwuo, e zigarala ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ NCDC ozi maka ya bụ ihe dapụtara.
Ọ gara n'ihu dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha jiri ncha na-akwọ aka ha oge ọbụla, gbara ịṄụ gari nakwa iri oke ọsọ.
Akụkọ ka na-abịa.










