Lassa Fever: Ọrịa a emefuola mmadụ atọ n'Ebonyi

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

N'Ebọnyị:

Dọkịnta Emeka Ogah bụ onye nlekọta ụlọọgwụ Federal Medical Center (FMC) dị n'Abakaliki, Ebọnyị steeti, kwuru na ọrịa ịba lasa a kpọrọ "Lassa fever" dị ire na steeti ha ugbua.

Ụlọọgwụ FMC Abakaliki

Ogah kwuru na ọnụọgụgụ ndị ọrịa a gburula na steeti ha akarịala anọ bụ ihe ngalaba "National Center for Disease Control" kpọpụtara bụ ihe nwụrụ.

Kama, Ogah kwukwara na ọ bụ kọmishọna ahụike nke Ebọnyị steeti ka ọ dịịrị ịkpọ okwu a aha.

Kọmishọna okwu ahuike dị n'aka bu Daniel Umezuluike, ekwuola na ọ bụ mmadụ iri abụọ (20) butere ya bụ ọrịa n'afọ a.

Dọkịta Umezulike

Mana mmadụ 14 bụ ndị a gwọrọla, ebe mmadụ atọ ka na-anata ọgwụgwọ. Mmadụ atọ ndị ọzọ nwụrụ anwụ n'ihi na ebuteghi ha ụlọọgwụ n'oge.

O kwukwara na mmadụ iri abụọ a abụchaghị ndị si Ebọnyị, kama na ụfọdụ n'ime ha bụ ndị si steeti agbataobi ndị Ebọnyị makana ọ bụ n'Ebọnyị ka ụlọọgwụ ukwu na-ahụ maka ọgwụgwọ ọrịa nje a, nke Bekee kporo "Virology Centre" dị.

N'Abuja

Ndị isi ọchịchị Naịjirịa kpọrọ ndị na-ekwuchitere mba dị iche iche akpọrọ "diplomatic community" na bekee nzukọ, ebe ha nọ gwa ha na agaghị ehigharị ntuliaka ọzọ.

Nzukọ maka ntuliaka

Ndị kwuru okwu na ya bụ nzukọ gụnyere Geoffrey Onyeama bụ mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta mba na mba, onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Abubakar Adamu na otu onye nọchitere anya ngalaba Inec.

Nzukọ maka ntuliaka

Dịka ha ka nọ n'ime nzukọ a, ndị na-akwado Ibrahim El-Zakzaky bụ onye ndu ndị otu Shiite e ji n'ụlọmkpọrọ kemgbe afọ atọ na ụma, bịara malite ime ngagharịiwe ebe ahụ.

Ndị na-akwado El-Zakzaky

Ha na-ekwu sị tọghapụ onye ndu ha ka o nwere onwe ya.

Ndị na-akwado El-Zakzaky

Ndị Ipman ekwuola:

Ngalaba na-ahụ maka ndị nọọrọ onwe ha na-ere mmanụ agbịdị akpọrọ Independent Petroleum Markerters Association of Nigeria bụ IPMAN n'aha ịchafụ, ekwuola na enweghi mgbe ha gwara ndị otu ha ree mmanụ ụgbọala ihe na-erughi narị na iri anọ na ise bụ ihe gọọmentị sị ka e ree ya.

Igwe e ji ere mmanụ
Nkọwa foto, Igwe e ji ere mmanụ

Nke a na-abịa ka ndị mmadụ na-ekwu na e nyere iwu ka ndị na-ere mmanụ ụgbọala ree ya n'ọnụ narị na iri anọ maka nhigharị e higharịrị ntuliaka.

A nwụchiela ndị ọrụ kọstọm na Legọs

Ụlọọrụ "Nigerian Customs Service" kwuru na anwụchiela ndị otu ha mmadụ anọ bụ ndị a kpọrọ aha gbasara mgbagbu otu nwaamadị n'okporoụzọ Lagos-Benin.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ Kọstọm bụ Joseph Attah, gwara ndị ntaakụkọ "News Agency of Nigeria (NAN)" nke a, ma gwakwa ha na a ga-akpụpụ onye gburu nwaamadị ahụ ụlọikpe.

N'ofesi,

Bernie Sanders dị afọ iri asaa na asaa kwuputara na ọ ga-eso zọọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka n'afọ 2020, ekwuola na obi siri ya ike na ọ ga-emeri na nke ugbua.

Bernie Snders

Ebe foto si, Getty Images

Cheta na Sanders nwaburu ike ya inweta ọkọlọtọ ndị Democratic pati na 2016, mana Hilary Clinton napụrụ ya ikike ahụ.

N'egwuregwu,

Enweghi onye meriri ibe ya ka Liverpool na Bayern Munich zutere na Champions League a gbara n'abalị.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Otu ihe ahụ mekwara ka Barcelona na Lyon zutere, mana kedụ onye ga-emeri mgbe otu ndị a ga-agba egbe buru ọ laa n'izu atọ na-abịanụ?

Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri taa:

Aha onyonyo, Nigeria Election 2019: 'Agaghị m atụ vootu makana atụọla ya atụọ'