'Chakwasa ịba lasa ọkụ dika esi mee Ebola'

Ebe foto si, Getty Images
Ọrịa Lassa Fever ka na-akpa mkpamkpa na-ala anyi bu Naịjirịa
Ka ọ dị taa, ya bụ ọrịa ogbugbu a na-ebutekarị site n'ahụ oke abatala Abia Steeti n'akwa Steeti ndị ọzọ.
Otu onye ọrụ ahụike na-ahụ ka ọrịa si agbasasị bi n'Enugwu bụ Chinenye Nwaekpe Kowara ịba lasa dịka ọrịa a na-ebute site n'oke ma ọ bụ anụmanụ ndị ọzọ.
Ọdọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha kpuchie ebe ọbụla ha dosara nri ndị dịka garrị, akwụkwọ nri, Breadị, mmanya ndị dị n'iko makana oke ahụ na-ebu ya bụ nje lasa nwere ike ịnyụkwasa ya mamịrị.
Nke a nwere ike ibute ọrịa ịba lasa ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Nwaekpe Kwara arịrị na ndị Dọkịnta n'akwa ndị ọru ahụike kachasị ebute ọdachị a n'ihi na ha anaghị akpachapụrụ onwe ha anya ọfụma.
Ọ rịọrọ gọọmentị ka ha were aka ahụ ha jịrị merie Ebola wee chakwasa ọrịa Lasa a ọkụ ma chụpụ ya n'ala anyị.
Chinenye Nwaekpe bụ onye ọrụ ahụike nke a na-akpọ 'Epidemologist' n'olu bekee, gwara ndị ọchịchị obodo nile ka ha kụọ ekwe wee gwa ndị mmadụ ụzọ mgbochị ọrịa bụ Lassa Fever.
Ọrịọrọ ndị ọbụla ka na erị oke ma ọ bụ anụ ọhịa ndị ọzọ ka ha wepụ aka enwe n'ofe tupu ọghọọ aka mmadụ.
Gere ihe okwuru ebe a n'uju:

Ebe foto si, Getty Images
Ụzọ mgbochi lasa fiva
Ndị ọrụ ahụike kwuru na ihe na-ebute lasa fiva bụ oke, site na mmamịrị ma ọ bụ nsị ya, ya mere:
1.Debe gburugburu gị ọcha, ekwela ka oke bịa nso na be gị
2.Erila ihe ọbụla oke nyụrụ nsị ma ọ bụ mmamịrị
3.Were ihe na-egbu nje hichaa gburugburu ebe oke nyụrụ nsị ma ọ bụ mmamịrị
4.Onye ọbụla ahụ ọkụ na-eme, kpọrọ ya ga n'ụlọ ọgwụ
5.Kpuchi onwe oge ị na-emetu onye ahụ na-adịghị aka
6.Mara etu isi ekwe ndị mmadụ aka
7.Mechie ebe niile nwere ohere oke nwere ike isi bata n'ụlọ gị
8.Ahụ rịa gị, ga n'ụlọ ọgwụ
9.Jiri ncha na mmiri na agba agba kwọcha aka gị oge niile










