Lassa Fever Outbreak: Etu e si eme ka garri ghara ibunye mmadụ ọrịa

Garị bụ nri ndị mmadụ na-erikarị na Naịjirịa.
Ebe ụfọdụ na-aṅụ ya aṅụ, ụfọdụ na-elo ya ka nri olulo.
Aha garị na-ewu ewu ugbua makana ndị mmadụ na-ekwu na iri ya nwereike ịbụ usoro e ji ebute ọrịa Lassa.
Ihe mere nke a bụ makana anaghị esi gari a na-aṅụ aṅụ n'ọkụ.
Isi nri n'ọkụ so n'ime usoro kachasị e ji egbu nje na-adị na nri.

Ihe mere garị ji ese okwu
Okwu garị malitere n'etu e si eme ya.
Njem garị na-amalite n'ugbo, ebe ọ ga-esi gaa ebe a ga-akwọ ya ma a bachasịa ya.
Akwọchaa ya, ọ bụrụzịa ighe ya eghe. E ghechaa ya, a gbaa ya n'akpa ebe a ga-esi na-ewere ya ọ ma a chọọ garị a na-elo elo maọbụ nke a na-awụnye na mmiri ṅụọ.
Gịnị jikọrọ garị na ịba Lassa?
Ebe ndị mmadụ na-esi ekwute okwu ịba Lassa na garị bụ na a na-eche na oke - bụ anụmanụ na-ebukarị ọrịa Lassa - na-abanyekarị na garị dị n'ụlọ ma ọ bụrụ na egbochighi ya ọfụma.

Mana, o nwekwara ndị na-agbasa garị n'anwụ ma ha ghechaa ya.
Oke bu nje a nwereike ijiri ohere a garị nọ na mbara/ezi banye n'ime ya, metọchaa ya mgbe ọ rịrị ya elu, ma tinyekwa ya nje ahụ.

Mmadụ kporozie ya wụnye na mmiri ṅụọ o kote okwu.

Ebe foto si, Reuters
Etu e si agbanarị isi garị bute ịba Lassa

Ọ bụrụ na ị goro garị n'ahịa lee ihe i ga-eme ka ọ bụrụ ihe agaghị ebunye gị ọrịa:
- Ọ bụrụ na ị na-elo ya elo, jiri mmiri gbọrọ agbọ ọfụma ọfụma mee ya tupu i rie ya, makana ndị ọkachamara kwenyere na mmiri ọkụ na-egbu nje Lassa ọfụma.
- Ọ bụrụ na ọ bụ nke ị ga-aṅụ aṅụ, ghee ya n'ọkụ ọfụma tupu ị ṅụọ ya makana ị maghị ije ya na etu ndị mere ya jiri mee ya.

Ọ bụrụ nke i ji aka gị eme ya:
- Gbado anya ịhụ na onweghi etu oke maọbụ ihe ọbụla siri banye n'ime ya site n'ugbo ruo oge agbanyere ya n'akpa nakwa ebe e dobere ya ka e mechara ya.

Site n'usoro ndị a, mgbochi ịba Lassa ga-enwe isi.

Mana, matakwa na ọ bụghi sọsọ garri ka e si enweta ya bụ ọrịa, onwe etu ahụ sị eme gị biko jiri ọsọ gaa n'ụlọọgwụ.

Akụkọ ga-amasị gị:









