Lassa Fever outbreak: Lekwa mkpamkpa Iba Lasa na-akpa n'Umuahịa nakwa ihe iri imaghị maka ọrịa a

Rat

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Oke bụ anụmanụ n'ebu ọria lassa

Ndị Abia ụjọ atụla ụnụ makana ministri na-ahụ maka ahụike na-egbochi ọrịa Iba bataralanụ na steeti ahụ ifesasi karịa etu ọ dị ugbua.

Ọ bụ dọkịta Joe Osuji bụ kọmishọna ahụike Abia steeti na-agwa ndị Abia nke a.

Osuji kwuru na ya ndị otu ya achọputala otu onye ọrịa ahụ ji ugbua ma na-enye ya ọgwụgwụ.

Ọ kwuru na otu gbata gbata anọrọla chịm ruo ụbọchị iri abụọ n'otu izaa ndị mmadụ nwere ike idanyere ọrịa ahụ.

Ọ rịọla ka ndị Abia chụpụ oke , kwụọ aka mgbe niile, dowe gburugburu ha ọcha, kwụsị ịṅụ "garri", sie nri ha n'ọkụ ọfụma tupu ha erie.

O kwukwara ka ha gaa n'ụlọ ọgwụ nọ ha nso ma ya bụ ọrịa banye n'ahụ ha.

Lassa Fever: Ihe iri ị maghị maka ọrịa ọjọọ a

Ọkacharamara n'okwu ahụike ọha bụ Dr Chuks Agunwa nke UNTH kọwara na ịba Lasa na-egbu mmadụ ma onweghị nleta n'oge.

Dokita ahụike ọha bụ Dr Agunwa akọwala na isi jọrọ ọrịa Lasa njo nke ukwu.

" Ọ na-egbu mmadụ rinne ọ banye gị n'ahụ ọ na-enye nnukwu nsogbu. Ọ na-ahịa ahụ ịgwọta mana "

Mana, "onye nwere lasa gaa n'ụlọọgwu n'oge, a ga agwọtali ya."

Ụzọ esi enweta ya

Dọkịta Agunwa kọwara na ọ dị ụzọ abụọ e si ebutekarị ịba Lasa:

  • Ịgbasa ọka, gari na ngwa nri n'okporoụzọ ebe oke ọhịa nwere ike nyụnye ya mamịrị maọbụ nsị
  • Site mmiri, ọsịsọ, ọbara, mamiri, nsị, agbọọ na mmiri ahụ onye nwere ọrịa lasa

Kedụ ka ị ga-esi ma na inwere ọrịa lasa?

Ihe ọrịrị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Otu ụzọ esi gbochi ọrịa Lassa bu n'ikpuchite ihe mmadụ na-eri eri.

Ọ naghị ewe anya ị mata onye nwere ọrịa Lasa n'ihi na njirimara ya na-eyi nke ịba ndị ọzọ dịka taifod, ịba wdgz.

Mana Agunwa dụrụ ọdụ ka ị gaa ụlọọgwụ maka nyocha ahụ ma ị hụ ihe ndị na-atụ aka na ị nwere ọrịa a dịka:

3 Mmadụ ịsị na oke arụ na-eme ya ( temperature karịa 38 degrees)

4. O na-eji isiọwụwa ebido

5. Onye ahụ na-agbọ agbọ

6. Ọbara si na mamiri, nsị nakwa na anya onye ahụ na-apụta (nke a na-egosi na ọrịa ahụ akarịala otu izuụka, na ọrịa ahụ eriela ahụ onye ahụ)

Lasa na Ebola enwere nyiri?

Ndị ọrụ ahụike

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mbaụwa toro Naịjirịa maka etu o siri hazie ọnọdụ oge Ebola batara

Lasa na Ebola nọ n'otu ezinaụlọ, ha abụọ bụ 'vịrọs'

7.Etu ha si egbu mmadụ yiri

8.Mana Ebola ka Lasa njo

Kedụ ihe i kwesiri ime?

10. Gaa ụlọọgwụ ozigbo i nwere njirimara a gụpụtara na 3,4,5 maọbụ 6.

Akụkọ ndị ga-amasị gị