Iran vs US: Britein ekeela nkwụcha

A họpụtala Boris Johnson ka Praim Minista Briten ọhụrụ

Ebe foto si, @BorisJohnsonTwitter

Dịka nsogbu dị n'etiti Iran na mba US na-akawanye njọ, mba Britein adọla ndị ala ha chọrọ ibia Naịjirịa aka na nti ka ha mụrụ anya dịka azụ n'ihi ihe egwu maọbụ ọgbaghara nwereike ịdapụta.

Ha gwara ha zere ebe a na-eme ngaghariwe maọbụ ebe e nwere igwe mmadụ.

Sadio Mane na Asisat Oshoala turu ugo CAF 2019

Mane na ASISAT

Ebe foto si, AFP/GETTY IMAGES

Sadio Mane na-agbara otu Liverpool nakwa Senegal bọọlụ eritela nturugo dịka ọkaibe Confederation of African Football's (Caf) nke afọ 2019.

Ọ piakasiri ndị dịka Mohammed Salah bụkwa onye otu Liverpool ibe ya nakwa Riyad Mahrez nke Manchester United were maburu ya bụ nturugo.

Mane dị afọ iri abụọ na asaa nyere ndị otu egwuregwu Liverpool aka mabanye na ọkwa Champions League nke 2018-2019 ma nyezuo goolu ruru iri atọ (30) n'asọmpị niile agbara n'izu gara aga.

Mane

Ebe foto si, AFP

Ọ natara nturugo na mmemme ahụ nke e mere na Hurghada, Egypt mana ndị ya na ya zọrọ ya dịka Salah na Mahrez abịaghị mmemme ahụ.

Nigeria agbaghị 'last' dịka Asisat Oshoala turu ugo ọkaibe Caf n'ogo ụmụnwaanyị.

Ọ kwaturu Ajara Nchout bụ ọgba bọọlụ Kamerun nakwa Thembi Kgatlana nke South Afịrịka wee maburu ya bụ nturugo.

Gere akụkọ ụwa na nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri taa

Aha onyonyo, Ọgbambọ: Ị ma Erisco? Lee ka N4200 sị mụtara ya ụlọ mmepụta tomato kachasị n'Afịrịka