USA and Iran: Ndị Nigeria bi USA a na-atụ ụjọ na agha nwereike ịda?

Ndị na-eme ngaghari iwe

Ebe foto si, Getty Images

Ebe niile na Sọshal Midịa ka akụkọ agha na-etiti mba Amerịka na mba Iran.

BBC jụrụ ndị Igbo bi na Amerịka etu ndụ ha sịrị dị kamgbe kepukepu magha bidoro dawa.

Nwaada Betsy Njemanze gwara BBC na ndụ ka dịkwa etu ọdi bu na Amerịka na ọnweghị onye na akụja.

Kama ọ kọwara na ọ bụ ndị ụmụ ha sọ na ndị agha mba Amerịka kaọ na eche uche.

Betsy Njemanze

Ebe foto si, Betsy Cookey Njemanze/Facebook

Nkọwa foto, 'Ọ bụ ndị ụmu ha so na ndị agha Amerịka ka uche na eche' Betsy Njemanze

O kwukwara na otutu ụmụnwoke sitere na steeti ebe o bi bụ 'North Carolina' agawala mba Iraq ilu ọgụ.

Nkea bidoro kamgbe egburu ochiagha ndị mba Iran bụ Qasem Soleimani.

N'otu aka ahụ ka Charlse Mbamara onye bị na obodo 'Atalanta' kwukwara na onye ọbụla na agara nke ya.

Ọ kọwara na ndị mba Amerịka kwenyere na onweghị ihe ndị mba Iran ga-eme ga erute ha n'ihi na atụmatụ nchekwa ha siri ike.

Ọ sị na kamgbe 9/11 ndị mba Amerịka ejighịzị nchekwa ha egwu egwu.