Donald Trump on Iran: Ndị mba Iran na-atụ 'asị ọcha' maka CIA

Trump

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola sị na akụkọ ndị Iran na-akọ na ha agbabọọla ọrụ nzuzo ndị Central Intelligence Agency (CIA) bụ asị ọcha.

Ndịisi na Tehran bụ isiobodo mba ahụ kwuburu na ha nwụchiri mmadụ iri na asaa bụ ndị mba ha ha na-enyo na ha bụ ndị ọrụ CIA, ma maa ha ikpe ọnwụ.

Lee ihe o dere n'elu Twitter ya:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'egwuregwu,

Antoine Griezmann ka banyere Barcelona kwuru na etu ndị otu ọhụrụ ya si agba bọọlụ na-amasị ya.

Griezmann

Ebe foto si, Getty Images

O kwuru na ọ ga-amasịkwa ya igbanwe etu o si agba bọolụ ka o nwee ike ị na-eme etu ibe ya mere.

Udele nwụrụ n'Enugwu steeti

Ndị ahịa Ihe

Ndị na-azụ ahịa n'Eke Ihe dị n'Awgụ, Enugwu steeti, ekwuola na ọ bụ eziokwu na udele karịrị ọgụ dara otu mgbe n'ahịa ahụ ma nwụọ, kamana ọ bụghị anụ ha riri gburu ha.

Otu onye Ihe gwara onye ntaakụkọ BBC na a na-enyo na o nwereike bụrụ na achịnyere ụtaba n'ime eriri afọ ehi e wepụtara n'ime ehi ahụ nwụrụ anwụ, nke udele ndị ahụ riri tupu ha anwụọ.

Ngagharịiwe ndị Shiites

Foto ọgụ ndị Shia na ndị agha n'Abuja

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị uweojii arịola ka ndị

Ọtụtụ mmadụ emerụọla ahụ dịka ndị Islamic Movement of Nigeria (IMN) a na-akpọ Shiites na ndị uweojii takọtara isi ọzọ n'Abuja.

Nke a bidoro dịka ha na-eme ngagharịiwe ka gọomentị tụhapụ onyeisi ha bụ Ibrahim El-Zakzaki eji na mkpọrọ kemgbe afọ 2015.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ndị Shia na ndị uweojii na-akwata ya n'Abuja

Onyeisiala Naịjirịa agọrọla aka na ụkwụ ya

Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Amabeghi mgbe Buhari ga-alọa na njem o mere gaa London

Onyeisiala Naịjirịa agọrọla aka na ụkwụ ya n'okwu na-efegharị na ọnọdụ nchekwa ndụ na akụ mmadụ emebiela kpam kpam na Naịjirịa.

Onye enyemaka pụrụiche nke onyeisiala n'okwu mgbasaozi bụ Garba Shehu kwuru nke a mgbe ụlọntaakụkọ Channels gbara ya ajụjụ ọnụ.

Shehu kwuru na udo dị na mpaghra ugwu nakwa na Niger Delta dịka ụmụ Naịjirịa na-ebeku goomentị ha kwụsị oke ogbugbu na-akpọtụ ebe niile.

N'akụkọ yiri ibe ya gọọmentị Naịjirịa asaala otu PDP maka ebubo imefu otu ijeri dọlla nke si n'akapego Naịjirịa amapụtara maka ịbuso ndị Boko Haram agha.

Garba Shehu kwuru na ebubo ahụ enweghi isi ma gaa n'ihu kọwa na esi n'ego ahụ zụọ otu ụgbọelu ọgụ ma debe ego nke fọrọ na ya.

Na mba ofesi,

Akụkọ si na mba Kongo apụta n'ụtụtụ a na-ekjwu amachiela ọgbakọ ndọrọndọrọ ọbụla n'isi obodo mba ahụ bụ Kinshasa.

Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ bụ AFP si kwuo, nke a bụ maka esemokwu dị n'etiti ndị nso otu ndọrọndọrọ dị icheiche.

N'egwuregwu,

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Aka chiburu otu Super Eagles bụ Bonfrere Jo ekwuola na ndị ọgba bọọlụ Naịjirịa ndị obere nwereike ịbuli otu Super Eagles elu maọbụrụ na eleta ha ma kuziere ha ọfụma.

O kwukwara na Naịjrịa nwere odogwu kwuru odogwu n'ịgba boolu na Naijirịa.

Akụkọ BBC Igbo na Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile