Shiites protest in Abuja: Ndị Shia gburu otu onyeisi anyị n'Abuja - Ndị uweojii

Aha onyonyo, Ọgbaghara dara n’etiti ndị ofufe Shiites na ndị uweojii n’Abuja
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị uweojii sị na onye uweojii bụ onyeisi ngalaba "Operations" n'Abuja bụ DCP Usman A.K Umar nara mmụọ n'ọgbaghara dara n'etiti ha na ndị otu "Islamic Movement of Nigeria" (IMN) e ji "Shia" maọbu "Shiites" mara.

Ndị Shia n'onwe ha gwara BBC na mmadụ 11 n'ime ha nwụrụ na ọgbaghara ahụ mere n'Abuja n'ụbọchị bụ nke iri abụọ na abụọ nke ọnwa Jụlaị.

Ndị uweojii sị na ebugara DSP Umar ụlọ ọgwụ mana ọnyaghị.

Ha asịkwa mmadụ abụọ nwere ọkwa "Assistant Superintendents of Police" nakwa onye ọrụ ụlọ ọrụ Channels Television merụrụ ezigbote ahụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ndị uweojii sị na ndị a gbakwara ụlọ ọrụ ndị gbata gbata "National Emergency Management Agency" (NEMA) na ụgbọala abụọ ọkụ.

Nke a bidoro dịka ha na-eme ngagharị iwe ka gọomentị tọhapụ onyeisi ha bụ El-Zakzaky onye e ji na mkpọrọ kemgbe afọ 2015.

Onye na-ekwuru ndị Shia bụ Ibrahim Musa gwara na ndị otu ha nwụrụ bu apa egbe n'ahụ.

Ọ sị na ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ nwereike rịa elu maka ndị uweojii Naịjirịa buru ụfọdụ ozu laa.

Ndi Shia na-eme ngagharị iwe

Ebe foto si, Twitter

Nkọwa foto, Ndị Shia sị na mmadụ 11 nwụrụ n'ọgbaghara a. Ndi uweojii si na-egburu otu onyeisi ha

Ndị uweojii sị na ha ji mmadụ 54 ha nwụchịrị n'ọgbaghara a.

Ha dere akụkọ na soshal midia ha na-ebo ndị a na-eme ngagharị iwe ebubo na ọ bụ ha butere nsogbu a.

Ndị uweojii kwukwara na ha na-agbalị ihu na udo chịrị.

Ndị Shiites na-ekwu na ụmụnwanyi na ụmụaka ha so na ndị a gbara egbe.

Ndị uweojii dere n'akara Twitter ha na nsogbu a kacha na mpaghara "Central Business District" na "Three arms Zone" nke Abuja.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ha kwukwara na ha na-agbalị ime ka ọgbaghara a belata.

Ọtụtụ ndị mmadụ nọ na Soshal Midịa ekwu ihe mere ma na ekwukwa uche obi ha.

Lee ihe ụfọdụ ndị mmadu n'ekwu -

Ndị akwụkwọ mgbasa ozi Punch tinyere ihe onyonyo na egosi ụgbọala ndị gbatagbata a na akpọ NEMA ebe ọ na agba ọkụ.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Otu onye bụ Fidah Nurudeen zaghachiri ndị uweojii na twitter tinye ihe onyoonyoo kwuo na ha na-agba ụmụnwanyị na ụmụaka egbe.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Ụfọdu dịka Tesleem Lawal na-ajụ sị "Gịnị ka ụmụaka n'eme ebe a na-eme ngagharị iwe?"

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Onye ọzọkwa jụrụ ma gọọmentị achorọ ka otu iyi egwu ọzọ dị ka Boko Haram billie?

Skip X post, 6
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 6

N'otu olu a ka Gimba Kakanda dọọrọ ndị gọomentị aka na nti na 'ọ bụ udịrị obị a ka ndị dịka Boko Haram siri bido'.

Skip X post, 7
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 7

N'afọ gara aga, ndị Shiittes na ndị uweojii chịpụkwara ya n'Abuja.

Aha onyonyo, Ndị Shiite na-eme ngagharị iwe n'Abuja