Ndị uweojii na ndị okpukpe Shiite na-ama aka n'Abuja
Akụkọ kwuru na otu onye anwụọla dịka ndị uweojii na ndị Shiite na-eme ngagharị iwe kwatara na Mọnde.
Ndị uweojii ji gasị anya mmiri na-achụpụ ndị mmadụ ndị na-eme ngagharị iwe na Unity Fountain dị n'akụkụ Transcorp n'Abuja.
A na-ele anya na ndị ahụ na-eme ngagharị iwe bụ ndị okpukpe Shiite na-achọ ka akpọpụtaz onyeisi ha bụ Ibrahim EL-Zakzaky bụ onye e ji kamgbe afọ abụọ.
Nke a na-abị dịka ndị uweojii kwuru na ha akagbuola ngagharị iwe niile ma nke bụ nke udo ma nke ndị na-abụghị nke udo n'akụkụ Unity Fountain dị n'Abuja.
Ndị ọnụ na-eru n'okwu katọkwara ihe ahụ ndị uwe ojii mere.
N'aka nke ọzọ, ọtụtụ ụmụ Naịjirịa n'igwe Twitter ekwupụtala etu obi dị ha na ya bụ ngagharị iwe.
Onye a kpọrọ Mr Aye Dee na twitter kwuru na ebe ọ bụ na ihe onyonyo pụtara gosiri na ndị Shiite ji okwute na-atụ ndị uweojii, ọ pụtara na ngagharị ha abụghị nke udo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
N'akụkụ nke ya, Kamal Abubakar kwuru ka ndị Shiite jiri nwayọ na-eme ngagharị ha n'udo ka ha nwe ike inweta ezigbo ọsịsa karịa iti ha ihe maọbụ e gbuo ha man̄ọbụ ha agaa nga.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Okafor Stanley kwuru na ya hụrụ ka ndị Shiite mebiri ọtụtụ ụgbọala ndị mmadụ oge ha na-eme ngagharị, o kwuru na ya anaghị emeziri ha ebere ọbụla.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ndị agha Naịjirịa kpụrụ onyeisi ndị Shiite na Kaduna n'afọ 2015 dịka ndị otu ha na ndị agha Naịjirịa nwere ịma aka n'ihu nke butere ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ.
Ndị agha kwuru na ndi otu Shiite chọrọ igbu onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Tukur Buratai ebe ha gbochiri ụzọ ụgbọala Buratai na-agafe.

Akụkọ ga-amasị gị:











