Balarabe Musa: Sọ ndịohi ga-abụnwu onyeisiala Naịjirịa

Balarabe Musa

Ebe foto si, Twitter/Onome Igugu

Nkọwa foto, Balarabe Musa

Balarabe Musa kwuru na ọ bụ ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị butere ihe isi ike na agaghị n'ihu n'ala Naịjirịa n'ihi na pasentị iri itoolu na itoolu (99%) ndị nọ n'ọchịchị bụ ndịohi.

Musa kwuru nke a n'ihe nkiri na-efegharị na Facebook nke gosiri ebe onye nwe ụlọọrụakụkọ SaharaReporters bụ Omoyele Sowore, chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala gara leta ya.

O kwuru na ndị agba ọchie ndị ndu Naịjirịa wụrụ Naịjirịa n'ala.

Musa sị: "Kedụ ụdị ndị ndu Naịjirịa nwere? Ụdị ndị ndu Naịjirịa nwere bụ ndịohi. Kemgbe repọblik nke abụọ bịachara na njedebe, kedụ ka a ga-esi nwee ndị ọchịchị ndị abụghị ndịohi?

"N'ezie, e nwere ndị esoghị. Anaghị m ekwu na ọ bụ ndị ndu niile bụ ndịohi. Mba, e nwere ndị esoghị mana echeghị m na ndị aka ha dị ọcha ruru otu pasenti. Pasenti iri itoolu na itoolu bụ ndịohi.

"Iji maa atụ, kedụ ka ị ga-esi merie ma ị gbado ụkwụ n'iwu na omenaala Naịjirịa? Kedụ ka ị ga-esi bụrụ onyeisiala Naịjirịa na-ebughị ụzọ bụrụ onyeohi? N'ihi na ọ bụ site n'izu ohi ka ị ga-esi nweta ihe ị chọrọ.

Ndọrọndọrọ ọchịchị n'ime pati na ntuliaka na Naịjirịa bụ okwu eji ego ekwu. Ike ego na-enye sikwa na mmerụaka. Ya bụ ka o siri dị."

"Anyị nwere nhazi ọnọdụ akụnaụba na ndọọndọrọ ọchịchị nke na-emetụta ka ihe niile si aga n'ala anyị. Ndị ndu nhazi a na-atụpụta bụ ndị ọdịmma onwe ha dị mkpa karịa nke ọha. Ebe ọ dị otu a, kedụ ka a ga-esi nwee ọganihu?

"E nyere m ọmụmatụ ọkwa onyeisiala, sị na onweghị onye ga-abụnwu onyeisiala ma ọ bụrụ na ọ bụghị onyeohi maọbụ nwee nkwado ndịohi. Nke a bụ eziokwu doro anya. ị ma na ịkwado ịzọ ọchịchị onyeisiala na Naịjirịa na-eri ijeri kwuru ijeri. Kedụ ka ị ga-esi nweta ijeri ndị a?"

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ