Usoro INEC ji eme ntuliaka ugbua ga-emegide pati ụfọdụ

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọ omeiwu nke nta bụ House Rep amalitela i megharị usoro ntuliaka elekshọn na Naịjirịa.
Osote onye isi ụlọ nta omeiwu ahụ bụ Sulaimon Yussuff Lasun tinyere aka n'akwụkwọ maka ị megharị ya bụ usoro.
Ha sị na otu ọdị ugbua n'ọbụ ntuliaka nke Onyeisiala bu ụzọ.
Ndị omeiwu chọrọ ka ọbụrụ ntuliaka nke ha ga ebuzọ, nke n'esote ya buru nke di omeiwu nke steeti. Nke Ikpeazu bụrụ nke ndị gọvanọ na nke onyeisiala.

Ebe foto si, Alamy
Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ n'ime ndị ọmeiwua kwenyere na-atumatua mana ọ bụ pati ndị ọzọ na abụghị APC bu ya n'isi.
Na megharia ha chọrọ ị me, ọ bụ INEC ga-aka ụbọchị a ga-eme ntuliaka ahụ.
Ka ọdị ụgbua, INEC eweputala usoro a ga e jị mee ntuliaka ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019.
Usoro ahụ dịkwa ka ha si eme ya mbụ.
Usoro ahụ sị na a ga ebu ụzọ mee ntuliaka onyeisiala na nke ndị nnọchịta anya nke omeiwu nke gọọmentị etiti mgbe onwe Febụwarị dị mkpụrụ ụbọchị iri an isii (16/2/19).
Ebe nke ndị Gọvanọ, ndị nọchite anya steetị na nke ndị okpuruọchịchị obodo ga a bụ na mkpuru ụbọchị nke abụọ n'onwa Maachị.
'Wepụnụ aka enwe n'ọfe'
Otu kwudoro onwe ha bụ Civil Society Situation Room akatọla agwa ndị ụlọ omeiwu nta bụ ndị House of Representative.

Ebe foto si, Clement Nwankwo/Facebook
Onye na-ekwuchitere ha ọnụ bụ Clement Nwankwo sị na ọ bụ n'ezie na ndị ụlọ omeiwu nke nta nwere ike igbanwe usoro a.
Mana ọ si ka mgbanwe nke a bido n'oge ntuliaka ọzọ karịa nke 2019 n'ihi na ewepụta la ụbọchị ndị a.
N'ọnụ ya, ndị ụlọ omeiwu nta gaa n'iru igbanwe usoro a, ọ ga-emebi ihe.








