N'Enugwu mgbọ atụgbuola nwaanyị n'akwamozu

Ebe foto si, Getty Images
Dịka a na-eme mmemme akwamozu n'obodo Amanato Mburumbu dị na okpuru ọchịchị Nkanu-East nke Enugu Steeti , ozu ọzọ dọrọ na mberede oge mgbọ tụrụ otu nwanyị bịara ụlọakwa.
Dịka akụkọ siri kwuo, ọha obodo gbakọrọ ili onye nwụrụ anwụ, otu nwoke a kpọrọ Daniel Chukwu ji egbe nta bịa n'ebe ahụ ma dịka ọ naa anyapụta egbe ahụ n'ubu ya, ma dịka ọ na anyapụta egbe ahụ, mgbọ pụrụ na ya ga-tụọ otu nwanyị dị ihe dịka afọ iri anọ, ma gbuo ya, ebe onye ọzọ merụrụ ahụ.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugu Steeti bụ Ebere Amaraizu kwuru na yabụ akụkọ bụ eziokwu ma kọwa na nwa amadị ahụ na-eneyere ndị uweojii aka inyocha ihe mberede ahụ mere.

Ebe foto si, Ebere Amaraizu
O kwuru na nwoke ahụ jiri egbe ya nke ike kwa, ọ maghị na ọ dị njikere ọgbụgba ga ebe a na-akwa ozu, ma oge ọ chọrọ inyapụ ya, mgbọ pụrụ na ya ga tụọgbo otu nwaanyị ma merụkwa onye na-akwa ozụ aha ya bụ Hawaya Nworiuzo ahụ.
O kwukwara na ndị mmadụ gbara ọsọ ngwangwa ha nụrụ ụda egbe n'ihi na ha chere na ọ bụ ndị ọchịehi wakporo ha.
Ọ gara n'ihu sị: " Ndị uweojii ebidola nyocha iji mata ihe mere, ebe onye a eboro ebubo na enyere ha aka na nyocha ahụ.
A natara ya egbe ahụ, ebe adọnyere ozu nwaanyị ahụ n'ụlọozu."

Akụkọ ga-amasị gị:








