Onye atụghị otuụzọnụzọiri ga-aga ọkụmmụọ - Adeboye

Enoch Adeboye

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụka Adeboye so na nke kachasị nnukwu na Naịjirịa

Ukọchukwu na-ahụ maka ụlọụka akpọrọ Redeemed Christian Church of God (RCCG) na Bekee bụ Enoch Adeboye, adọọla ndị ụka ya aka na ntị maka ịkwụ ụgwọ otu ụzọ n'iri nke ndị Bekee kpọrọ "tithing".

Okwu banyere "tithing" bụ ihe butere ezigbote ọgbaghara n'etiti ndị ụka na ndị ụkọchukwu mgbe Maazi Freeze, bụ onye mgbasa ozi na-arụ ọrụ na Cool FM, kwuru na ndị otu Kraist ekwesịghị ịkwụ ụgwọ a makana ọ sị na ọdịghị n'akwụkwọ nsọ.

Okwu a Freeze kwuru tinyere ndị ụkọchukwu na gbagharịa nke mere ka ha chọwa etu ha ga-esi kọwaara ndị otu ha na ịkwụ "tithe" dị mkpa.

Ụfọdụ n'ime ha kwuru na ha wetara ikike ha ji na-ana "tithe" n'akwụkwọ nsọ, mana Freeze gwara BBC na ọ bụ n'akwụkwọ nsọ agba ochie, ma kọwaa na Kraịst akwadoghị ịkwụ ụtụ a.

Mana ugbua, okwu a Adeboye kwuru n'emume ndị Redeemed na-eme kwa afọ nke ha kpọrọ "Holy Ghost Service" ga-akpalite ọgbaghara a ọzọ.

Okwuru ka ndị ka na-aghọtaghịe "tithe" gee ya ntị ma nụrụ ihe o kwuru. Ọ gakwara n'ihu gwa ndị ụkọchukwu ya ka ha nye ndị ha na-edu ndụmọdụ maka ọdachị ga-eso ha ma ha akwụghị "tithe".

"A na m enye unu ncha ohere ichegharị n'abalị a, ma laghachị ozugbo emechara nzukọ a gaa gozi ndị unu na-edu nchegharị a," Adeboye gwara ndị ụkọchukwu ya.

Adeboye kwukwara sị ka ha gwa ndị ụka ha na onye anaghị akwụ ụtụ isi nke ụka agaghị eso ndị ga-aga elu igwe.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ