Mmadụ 15 n'ime 112 ụmụakwụkọ Chibok fọrọ ndụ - Salkida

Ebe foto si, Getty Images
Taa bụ ụbọchị 14 nke ọnwa Epreelụ ga-eme ya afọ anọ ndị Boko Haram ji tọrọ ụmụnwaanyị ruru 219 n'ụlọakwụkwọ ha n'obodo Chibok dị na Borno steeti.
Cheta na ndị Boko Haram tọrọla ụmụakwụkwọ a n'afọ 2014 n'ụlọakwụkwọ ha bụ Government Secondary School, Chibok, nke mere ka ụwa niile tinye ọnụ.
N'agbanyeghị na ndị Boko Haram nọ na-ewepụta ihe nkiri na-egosi na ha ji ụmụakwụkwọ ahụ, ụfọdụ ndị Naịjirịa ekweghị na-eji ha eji.
Onye ntaakụkọ so na ndị gara okwu maka ịhapụ ụmụakwụkwọ mgbe ihe a mere bụ Ahmad Salkida, gbara ama na ọ bụ nanị ụmụagbọghọ iri na ise (15) fọrọ ndụ n'ime mmadụ otu narị na iri an abuo (112) ka nọ n'aka ndị Boko Haram.
BBC jụkwara otu n'ime odeakwụkwụ nta akụkọ gọọmenti etiti bụ Garba Shehu ihe o chere maka nke ahụ.
N'ọsịsa ya, Shehu zara na ya "amaghị maka nke ahụ".
Na nso nso a, gọọmentị Naịjirịa wepụtara otu ijeri dọla ha sị na ha ga-eji buso ndị Boko Haram agha.

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Getty Images
Tupu ụmụakwụkọ a ebido ịpụta n'agbụ n'ụzọ dị icheiche, ma ndị gbafuru agbafu ma ndị eji gbanweta ndị Boko Haram eji eji n'ụlọmkpọrọ, onyeisi Boko Haram bụ Abubakar Shekau, ziputere ihe nkiri gosiri ka ya na ọtụtụ n'ime ha nọ, iji kparịa gọọmentị Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images

Mmadụ ole atọghapụrụla
Afọ abụọ gachara tupu ahụ otu n'ime ụmụakwụkwọ a.
- A hụrụ onye nke mbụ n'ọhịa Sambisa ebe o ku nwa ọ mụrụ ka ọ nọ n'agbụ ndị Boko Haram.
- Onye nke abụọ gbanahụrụ ndị ji ya n'ọnwa Septemba 2016.
- N'ọnwa Oktoba 2016, ndị Boko Haram tọghapụrụ mmadụ 21 n'ime ha.
- Onye ọzọ gbapụtara n'ọnwa Jenụwarị 2017.
- N'ọnwa Mee nke afọ 2017, ndị agha ji ụfọdụ ndị Boko Haram a tụrụ mkpọrọ gbanweta ụmụakwụkwọ 82.

A na-eche na Boko Haram ka ji ụmụakwụkwọ 113, ebe ụfọdụ akụkọ na-ekwu na ụfọdụ n'ime ha anwụọla.

Ebe foto si, Getty Images
Kamgbe eji tọrọ ụmụakwụkwọ Chibok, gọọmentị ọzọ abanyela n'ọkwa ọchịchị na-achọkwa ịzọ ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ.
N'ọnwa Maachị, Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwere nkwa ịgbaghara onye Boko Haram ọbụla ga-echegharị ma chilie aka elu.

Ebe foto si, Getty Images
Cheta na atọghapụkwara otu nwata akwụkwọ ọzọ bụ Salomi Pogu, n'ọnwa Jenụwarị 2018.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ụmụakwụkwọ a
Ụfọdụ ndị na-eru n'okwu na ndị na-akwado ihe gbasara ntọrọ ụmụakwụkwọ Chibok kwuru etu o si metụta ha n'elu Twitter.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

End of X post, 3

End of X post, 4

End of X post, 5