
Ndị e chere na ha bụ Bọko Haram wakporo ụlọakwụkwọ ụmụnwaanyi dị na Dapchi,Yobe steeti na mpaghara ọwụwaanyawụ ugwu-awụsa, Naịjiria.

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Buhari kwere nkwa na a ga-agbaghara ndị otu Boko Haram kwenyere ịhapụ ngwaọgụ ha ma chọọ udo.
Buhari kwuru nke a mgbe ọ na anabata ụmụaka ụmụakwụkwọ Dapchi agbapụtara n'aka ndị Boko Haram na Aso Rọk, Abụja n' ụbọchị Fraide.
"Dịka anyị na-agba mbọ ịgbapụta ndị ala anyị ndị Boko Haram ji eji, gọọmenti dị nkwadebe ịnabata onye otu Boko Haram ọbụla hapụrụ ngwaọgụ ya, hazigharịa ndụ ya ma nabatakwa ya n'etiti ndị mmadụ."
"Ahụhụ ala anyị tarala n'ihi ọgbaghara dị iche iche ezuola. Gọọmenti na-arịọ ka onye ọbụla hara udo.
O kwuru na gọọment mezuru nkwa o kwere ndị a tọrọ ụmụ ha na Dapchi, Yobe steeti site na iso ndị Boko Haram nwee mkparịtaụta nke mere ka ha gbarapụ ụmụaka ha ji.
'Ekwere m nkwa na gọọment ga-eme ihe niile iji gbapụta ụmụaka ahụ a tọrọ ma nyekwa ndị ọrụ nchekwa iwu ime ihe niile iji kpọlata ụmụaka ahụ n'udo. Anyị sị ụzọ azụ ụlọ mee ya. Anyị nwere mkparịtaụka nke mịtara mkpụrụ."
Buhari kwukwara na ọchịchị ya dị njikere ibuso iyi-egwu agha, ma kpọkuo ndị Naijiria ka tinye aka.
O kelere ndị Naijiria niile na ndị mba ụwa maka ekpere na enyemaka ha nke mere ka ịzọpụta ụmụaka ụmụakwụkwọ ahụ nwe isi.