Ụzọ ị ga-eji chekwa akara gị na Facebook.

Cambridge Analytica bụ ụlọọrụ mba Britain na-ahụ maka ichekwa ozị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Cambridge Analytica bụ ụlọọrụ mba Britain na-ahụ maka ichekwa ozị

Akụkọ juru mba ụwa bụ na ụlọọrụ Cambridge Analytica na Facebook jiri ozi ọtụtụ ndị mmadụ dị na Facebook eme ndọrọ ndọrọ ntuliaka.

Nke a butere oke nsogbu na mba ụwa niile dịka ometutara ọtụtụ ndị na-eji Facebook eme otu ihe maọbụ nke ọzọ.

Cheta na onye nwe Facebook bụ Mark Zuckerberg arịọla arịrịọ, ebe o kwuru na Facebook mere njeghe.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ

N'ime ọgbaghara ahụ, ndị Cambrige Analytica kwuru na aka ha dị na ntuliaka Naịjirịa nke afọ 2015.

Ha kwuru na otu onye nwere egona Naịjirịa nyere ha ego dị nde dọla abụọ na puku narị asatọ, iji mee ka Jonathan merie na ntuliaka afọ 2015.

Ụzọ mgbapụta:

N'iji cheekwa akara Facebook gị, onye ọkacha mara n'ihe gbasara technụzụ bụ Opeyemi Olugbemiro kọwara ụfọdụ ụzọ mmadụ ga-eji chekwa onwe ya;

  • Site na ileda ụfọdụ ozị n'abata na Facebook gị nke na-ajụ ajụjụ dịka; ịchọrọ ahụike, ịchọrọ ịlụ nwaanyị n'akwa ajụjụ ndị ọzọ.
  • Kpochapụ ozi ọ bụla n'abata na Facebook gị nke na-edoghị gị anya.
  • Were akara na-enweghị onye ga-achọpụtali kpabie Facebook gị
  • etinyela ozị gị ọbụla dị oke nkpa na Facebook.

Gere ihe o kwuru n'olu bekee:

Aha onyonyo, Facebook: Ụzọ ị ga-eji cheekwa Akara gị