YCE: Ndị ugwu bụ nsogbu Naijiria

Ebe foto si, Kunle Ọlajide
Otu ndị okenye ndị Yoruba nke a kpọrọ Yorùbá Council of elders (YCE) na bekee kwuru na ndị Ugwu-Awusa bụ nsogbu na -adọghachị Naijiria azụ.
Odeakwụkwọ otu ahụ bụ dokita Kunle Olajide, kwuru nke a na ọsịsa okwu onyeisi otu ndị ugwu bụ Ibrahim Coomassie, si na Naijiria agaghị adị ndụ ma e wepụ Ugwu.
Coomassie onye rụburu ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii Naijiria tụrụ arịrị na ọgbaghara na nsogbu nchekwa bụ nsogbu kachasị emetụta ndị Ugwu ma kwuo na"Anyị na ewezụga Ugwu, Naijiria agaghị adị ndụ. anyị ga-akwwadosi ya ike na eme ihe annyi na-ekwu maka ọdị mma ndị ala anyị."
Akụkọ ga-amasị gị:
Mana Olajide na mgbarịtaụka ya na BBC kwuru na Naijiria kwesiri ịhazigharị ka mpaghara ọbụla jiri ihe dị na ya gban mbọ ọganihu ha.
""Uzọ Naịjiria ga-esi ga n'ihu bụ ka ahazịgharị ala anyị na mpaghara, na mpaghara. Ka mpaghara ọbụla na-akwụ Abụja dịka ezi mee ya bido n'afọ 1955 rue 1966 mgbe ndị agha were ọchịchị(gọọmentị etiti ụgwọ."




