Dapchi: Ndị agha na ndị uweojii enwela nghọtaghi

Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa na-arụ ụka maka etu esi hazie nchekwa na Dapchi bụ ebe ndị ntọọ tọọrọ ụmụakwụkwọ na izu ụka gara aga.
Ụnyahụ, ka ndị agha Naịjirịa zipụrụ ozi na ha lanyere ndị uweojii nchekwa obodo Dapchi mgbe ha wepụrụ ndị agha na echekwa obodo ahụ, ndị uweojii gọnariri ha.
Sumonu Abdulmaliki, bụ onyeisi ndị uweojii na Yobe steeti, zipụrụ ozi nke ya, na-ekwu na onweghị mgbe ndị agha gwara ha na na ha na ewpụ ndị agha nọ ọrụ nchekwa na Dapchi.
"Ọ okwu asi na okwu na-agbagwojuanya ka ndị agha kwuru. Onweghi mgbe ha lanyere anyị ebe nchekwa ha," Abdulmaliki kwuru.
Cheta na ntọrọ a tọọrọ ụmụakwụkwọ a na Dapchi bụ ọzọ na akpam ike a na-ebo ndị Boko Haram kemgbe ha tọọrọ ụmụakwụkwọ na Chibok n'afọ 2014.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:



























