Mwakpo Dapchi: Ụmụaka 101 ka akpọghachitere

Aha onyonyo, Agaghị m ịlaghachị akwụkwọ - Nwataakwụkwọ Dapchi akpọghachitere

Mịnịsta ọrụ mgbasaozi dị naka bụ Lai Mohammed edepụala akwụkwọ gbasara ụmụaka ụmụnwaanyị Dapchi bụ ndị Boko Haram tọrọ ụbọchị 19 Feburuwarị 2018.

Lai Mohammed kwuru na iwu onyeisiala Buhari nyere ndị ọrụ nchekwa ka ha chọọ ụmụaka ahụ amịtala mkpụrụ dịka ha nwetara mmadụ 101 site n'ime ụmụaka 101 bụ ndị a tọọrọ.

Mohammed kwuru na ụmụakwụkọ 101 bụ ndị edepụtara aha ha ebe a ka na-agbapụta ụmụaka ahụ.

Ụmụ Dapchi

Ebe foto si, Isaac Linus Abrak

Nkọwa foto, Ụmụaka ise nime ụmụ Dapchi ahụ nwụrụ oge a kpọrọ ha

O kwuru na a gbapụtara ụmụaka ahụ n'ebe elekere atọ nke isi ụtụtụ taa site n'ụzọ azụ nakwa na-enyemaka ndị enyi Naịjirịa na-achọghị ihe ngo ọbụla.

N'okwu ya, "Ime ka mgbapụta ahụ baa uru, gọọmenti nwere nghọta na tigbuo zọgbuo abụghị ụzọ a ga-eji kpọlata ụmụaka ahụ maka na aga etinye ha n'ihe ize ndụ.

"Nke a kpatara na ejighi ike wee kpọlata ha."

Lai Mohammed kwukwara na oge a na-akpọlata ụmụaka ahụ, e nwere iju oyi na agha a na-ebu n'ụfọdụ ebe ka e nwee ike kpọlata ha n'udo.

Ụmụaka Chibok bụ ndị a tọọrọ n'afọ 2014 alọtachabeghi.

Ndị mụrụ ụmụaka kwuru na atọghapurụ ụmụ na ụtụtụ Wenesde.

Nna otu n'ime ụmụaka bụ Kundili Bukar gwara BBC na ọ ndị a na-eche na ha bụ ndị Boko Haram kpọlata ha.

O kwukwara na ụmụaka zịkọrọ na ahụ adịghị ha mma.

Ụmụaka kwuru na ise n'ime ha nwụrụ mgbe Boko Haram tọọrọ ha makana ụgbọala ejiri buru ha kpachiri akpachi.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ