Mwakpo Dapchi: Boko Haram akpọlatala ụmụakwụkwọ ha tọrọ

Government Girls Science and Technology College

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nlọta ụmụakwụkwọ Dapchi adịghị ka nke ndị Chibok
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụmụakwụkwọ ndi Boko Haram tọọrọ n'obodo Dapchi n'ọnwa Febụwarị alọtala.

Cheta na ndị Boko Haram tọọrọ ụmụakwụkwọ 110 n'ụlọakwụkwọ ụmụnwaanyị nke gọọmenti bụ Government Girls Secondary School dị na Dapchi n'ọnwa Feburụwarị nke afọ a.

BBC Igbo nwetera ozi na ụmụaka ahụ batara obodo Dapchi n'isi ụtụtụ taa.

Anya hụrụ ihe a mere kwukwara na ndị agha Naịjirịa hapụrụ obodo Dapchi ụnyaahụ, ihe mere eji na-eche na o nwere ike ị bụ nkwekọrịta onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na ya na ndị Boko Haram ga-enwe iji gbapụta ụmụakwụkwọ a.

O kwukwara na o bụ ndị Boko Haram kpọlatara ụmụaka ahụ.

Ụmụ akwụkwọ Dapchi

Ebe foto si, Yobe State Government

Nkọwa foto, Ụmụakwụkwọ 76 ka a kpọghachiter

Ndị Dapchi ụfọdụ gwakwara BBC na ha hụrụ ụmụakwukwọ ahụ. Ihe a bụ otu ọnwa na izuụka abụọ a tọọrọ ụmụakwụkwọ a n'ụlọakwụkwọ ụmụ nwaanyị na Dapchi.

N'ụtụtụ taa, obodo Dapchi tetere n'ụra nweta ọgbaghara ka ahụrụ ụmụaka ka ha na-aga ụlọ onye na-achị obodo ha.

E kwuru na ụfọdụ ụmuaka ahụ gbagara be ha.

Amachabeghị etu esiri kpọlata umụakwụkwọ a, mana akụkọ na-ekwu na onwereike ịbụ na mmadu ise n'ime ha anwụọla.

Onyeisi ndị uweojii na Yobe Steetị bụ Abdulmaliki Sunmonu kwuru na ya ka na-alọta nchọpụta maka ihe a.

Ndị gọọmentị Naijirịa na onwe ha ekwuola okwu banyere nlọta ụmụaka lotara na Twitter:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Onyeisi ndị na agba mbọ maka ihu na ụmụaka ndị Chibok a tọọrọ na 2014 lọtara bụ nke akpọrọ "Bring Back Our Girls" bụ Ngozi Ezekwesili etinyela onu n'okwu:

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ihe a mere ugbua ga-enyere onyeisiala Naịjirịa aka iku ụme maka ọku ndị mmadu kwanyere ya n'ọkpụ ịhụ na ụmụaka a lọtara.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ