Etu ndị Sinetọ si agbari ego Naijiria

Ebe foto si, Getty Images
Akwụkwọ ahụ zịpụtara na a na-akwụ onye sinetọ ọbụla dịka ego ha na-emefu n'ịrụ ọrụ ha kwa ọnwa atọ gụnyere; nde naira 1.8 maka ịzụ akwụkwọ akụkọ, nde naira 10 maka ime njem n'ala Naijiria, nakwa nde naira 1.5 maka ilezi komputa.
Agbakọ ya, ihe nke a pụtara na onye Sinetọ nwetara nde naira 1.8 million maka ịzụ akwụkwọ akụkọ ọnwa atọ na-azụ akwụkwọ akụkọ pụtara puku naira iri abụọ (20,000) kwa ụbọchị, ebe ọ na e mefu N111,000 kwa ụbọchị iji mee njem ụgbọala maọbụ nke ụgbọelu.
Ego ndị ọzọ gụnyere akọrọngwa e ji arụ ọrụ, nde naira 3; ego maka ilezi ngwa ọrụ nde naira 1.6; izipụ akwụkwọ ozi (postage), puku narị naira ise (500,000); ile ọbịa nde naira 6.8 ; ibi akwụkwọ na ihe oriri, nde naira 1.4; akọrọngwa kọmputa, nde naira 2 na ilezi ụgbọala, otu nde naira.
Dịka ụlọakụkọ Premium Times siri kọwa, ha nwetara akwụkwọ ahụ n'aka onye bụbu onye sinetọ bido n'afọ 211 rue n'afọ 2015 oge ndị ụlọomeiwu ukwu na-anata nde naira 45 ọnwa atọ ọbụla.
Akwụkwọ ahụ nke a kpọrọ, " Akwụkwọ nkọwa ka e siri mefuo ego' na-atupenye ndị Naijirai azụ banyere otu ndị Sinetọ si emefu ego ala anyị.
Akwụkwọ a na-eso ama nke onye sinetọ si Kaduna steeti bụ Shehu Sani gbara na ndị sinetọ na-eri nde naira 13.5 kwa ọnwa, ozi nke butere oke iwe ọha ndị Naijiria na nso nso a.

Ebe foto si, @Shehu Sani
Agbanyeghị na akwụkwọ ahụ nke Sinetọ ahụ achọghị ka a kpọ aha ya n'ihi ịtụ egwu ihe ndị nddị Sineto ndị ọzọ maọbụ ndị na-akwado ya ga-eme ya, gosiri etu ndị ụlọomeiwu si agbarị ego anyị karịa ego ole nke ngalaba na-ahụ maka ihiwe ụgwọ ọnwa ndị ọrụ gọọmenti a nke a kpọrọ Revenue Mobilization Allocation and Fiscal Commission (RMAFC) na bekee ma bụrụ kwa ego a tinyerela na bọgeti nke ụlọoomeiwu.
Dịka iwu siri kwuo, onye Sinetọ kwesiri imefu puku naira 202,640 na ịzụ azụ akwụkwọ akụkọ , nke a bụ otu ụzọ n'ụzọ iri ụgwọ ọnwa ya bụ nde naira abụọ( N2,026,400.00.)
E lee ya anya nke ọma, nke a pụtara na ndị Sinetọ 109 natara ihe dịka nde naira 314 dịka ego ha mefuru na-mgbagharị ịrụ ọrụ ha nke a kpọrọ 'runnning cost' na bekee, site n'afọ 1919 rue afọ 2016 mma mefuo nde naira 53 kemgbe afọ atọ onyeisiala Muhammadu Buhari jiri banye n'ọchịchị.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe mbụ na akwụkwọ ahụ gosiri na sinetọ ahụ gbariri nde naira 45 na nje mba ofeesi, n'afọ 2012; nakwa nje n'ime naijiria nde naira 10, ebe nde naira 7.4 gara na ihe ndapụta nke a kpọrọ 'contingency' expenses' na a bekee.
Ama gbara ụlọakụkọ Premium Times na a na-ele onye omeiwu anya iweta akwụkwọ ngosi ihe onye zuru(receipt) iji kwado okpookpo ego e depụtara.
Ndị mgbaama kwuru na ọtụtụ ha na-eji akwụkwọ ngosi ihe onye zuru adịgboroja e me nke a n'ihi enweghị ezi nkọwa ga-akwaado oke mmefu ego ndị a, ma kọwa na 'omenala ka na-aga n'ihu rue ugbua.









