Onyinye na-edoghị anya ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-enye

Kedụ ihe kpatara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ji enye ndị ha na-anọchite anya ụdị onyinye ndị a?
N'ụbọchị ole na ole gara aga, onyinye Sinetọ Mao Ohuabunwa na-anọchite anya ndị Abia North na Sineeti bụ okwu ndị mmadụ kpụ n'ọnụ n'igwe okwu Twitter.
Ụfọdụ nọ na-ajụ ihe kpatara ọ ga-eji nye ndị mmadụ ite eji eghe ihe na ekwuọkụ gaasị ebe ọ sị na ọ bụ nkwadolite ka ọ chọrọ ime ha.
Mana BBC gbara Mao Ohuabunwa ajụjụ ọnụ ebe o kwuru sị na onweghi mwute maka ihe o mere.
Ọ gwara onye ntaakụkọ BBC na ọ bụ iji mezupụta nkwa ya kwere ndị mụrụ etu e si eghe ihe na 2017.
Ọ sị na ọbụghị nanị ite eji eghe ihe na ekwuọkụ gaasị, na o nyekwara onye ọbụla n'ime ha puku 50.
Sinetọ Ohuabunwa abụghị nanị onye ndọrọndọrọ ọchịchị nyerela ndị mmadụ ụdị onyinye a.
Lee ndị ọzọ ebe a:
- N'afọ 2017, Gọvanọ ndị Benue steeti bụ Samuel Ortom kesara baro (wheelbarrow n'olu bekee) nye ndị ntorobịa
- Sinetọ Shehu Sani nyere ndị mmadụ redio ntakịrị n'afọ 2016
- Gọvanọ ndị Kano steeti bụ Abdullahi Ganduje nyere ndị ọ na-achị ihe a kpọrọ noodles n'olu bekee, ihe ndị eji eme tii, akwa, achịcha na nkata n'afọ 2017.
- Gọvanọ ndị Osun steeti bụ Rauf Aregbesola kesara akpa osikapa ebiri ihu ya na aha ya.
- Gọvanọ ndị Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose bụ onye ama ama n'ikesa ihe ndị dịka osikapa, narị naịra ise, ọkụkọ, mmanụ ọpapa na ngwa nri dị icheiche.
Ụdị onyinye a o nwere ike ịkwụsị na Naịjirịa?










