Nigeria Election 2019: Etu ị ga-esi tụọ vootu n'ụbọchị ntuliaka

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
Dịka ọ fọrọ ụbọchị ole na ole tupu ụbọchị ntuliaka eruo, ọ nwere ụfọdụ ihe ị kwesiri ịma.
Ngalaba na ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec ewepụtala ụzọ asaa ị ga-esi tụọ vootu gị n'ụzọ kwesiri.
Nke a kachasị mkpa n'ihi na ọ bụ ụzọ ị ga-esi tinye anya gị ma hụkwa na ihe niile gara etu o si kwesi.
Lee ihe ndị asaa ahụ ebe a:

Ebe foto si, Getty Images
Mbụ
Ị ruo n'ụlọ ntuliaka nke bekee kpọrọ "Polling Unit", ị ga-eme ihe abụọ ebe a; nke mbụ bụ na ị ga-akwụnye n'ahịrị dịka ndịọzọ nọ ebe ahụ.
Nke ọzọ bụ na ị ga-egosi PVC gị nakwa onwe gị nye onyeisi ndịọrụ ntuliaka ga-anọ ebe ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe abụọ
Onye ọrụ ọzọ ga-ajụ gị ebe PVC gị dị ka o nwee ike nyocha ma ọ bụ nke ezigbo ya.
Ọ ga-agwakwa gị binye aka n'igwe 'card reader' iji mata ma edenyere aha gị n'ụlọ ntuliaka ebe ị nọ.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe atọ
Onye ọrụ ọzọ ị ga-ahụ ga-anara gị PVC gị iji mata ma aha gị na njirimara gị niile ọ dị n'akwụkwọ i ga-eji eme ntuliaka.
Ọ ga-atụpọ aha gị, nyeghachi gị PVC gị ma detụ uhie anaghị eme mgbụcha na mkpịsịaka gị iji gosi na ị tozuru ime ntuliaka.
Ọ bụrụ na aha gị adịghị n'akwụkwọ ndị ga-eme ntuliaka, agaghị ekwe ka ị mee ntuliaka.
Ihe anọ
Onye ọrụ ya bụ ịchịkọta ntuliaka ahụ ga-ama njirimara, dee ụbọchị ọ bụ ma binye aka n'azụ akwụkwọ ị ga-eji mee ntuliaka nke pụtara "ballot paper" na bekee.
Ọ ga-alọkọ akwụkwọ ahụ ma nye gị ya gosikwa gị ebe zoro ezo ị ga-anọ mee ntuliaka.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ise
Ị ga-ebinye aka n'uhie anaghị eme mgbụcha, ma binyekwa ya n'akụkụ pati maọbụ onye masịrị gị.
Ị ga-alọkọ akwụkwọ ballọt ahụ etu onye nchịkọta ntuliaka siri nye gị ya.
Ihe isii

Ebe foto si, Getty Images
Ị ga-esi n'ebe zoro ezo pụta ma tụnyekwa akwụkwọ balọtụ gị n'ime akpati balọtụ n'ihu ọha niile nọ ebe ahụ.
Ihe asaa

Ebe foto si, Getty Images
Ị ga-ejiri nwayọ pụọ n'ụlọ ntuliaka ahụ maọbụ ị cheretụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe pụtara na ntuliaka ahụ.
Matakwa na Inec ga-amado ihe pụtara na ntuliaka ọbụla ebe mmadụ niile nọ n'ụlọ ntuliaka ga-ahụ ya.









