2019 Elections: Leekwa ihe ị ga-eme ka a ghara ịgụpụ vootu gị

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahụ maka ntụlịaka na Naịjirịa niile esila n'ọnụ Mazi Abuonum Ufenne kọwa ihe ga-eme ka akagbuo vootu gị.
O dị mkpa ịgee ntị na ihe ndị a ka onye akwụkwọ vootu were baara gị uru na ntuliaka 2019.
Lee ụzọ ise ị ga-eji gba mbọ hụ na onweghị ihe mere vootu gị nakwa na-agụnyere ya na vootu ndị ọzọ.
1) Ebinyela aka n'elu ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ọbụla

Ebe foto si, Getty Images
Binye ya n'ohere enyere n'akụkụ ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ahụ n'elu akwụkwọ vootu.
2) Edela edemede n'elu akwụkwọ vootu gị

Ebe foto si, Getty Images
Ma aha gị o, ma mkpụrụ edemede, ma akara edemede, edela ihe ọbụla n'elu akwụkwọ vootu.
3) Ejila ihe ọbụla metọ akwụkwọ vootu gị

Ebe foto si, Getty Images
Ọkachasị mmanụ mkpisi odee nke eji eme ntụlịaka, gbaa mbọ hụ na o nweghi ihe iji metọ akwụkwọ vootu gị.
4) Afịkọna akwụkwọ vootu gị

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụrụ na ịfịkọọ akwụkwọ vootu gị, ọ ga-arịa ahụ ịchọpụta etu isi binye aka nke ga-eme na a ga-akagbu ya.
5) Etinyela akwụkwọ vootu gba ọtọ

Ebe foto si, Getty Images
Isi dị na ntụliaka bụ ịhọpụta otu ndọrndọrọ masịrị gị. Ya mere na ịtụnye akwụkwọ vootu gba ọtọọ na agaghị agụnye uche gị na ntụlịaka.









