Osun State election result: A ga-emegharị ntuliaka

Onye rụru ọrụ dịka ihe Bekee kpọrọ 'returning officer' na ntuliaka Ọshụn bụ Joseph Adeola Fuwape, ekwuola na a ga-emegharị ntuliaka ahụ.
O kwuru na ọnuọgụgụ vootu niile a tụrụ na ya bụ ntuliaka gosiri na ihe kewara pati abụọ nọ n'isi erụghị mmadụ ole nwereike ịtụ vootu na 'ward' ndị nke akagburu.
Ndị mmadụ nwereike ịtụ vootu ebe a ga-emegharị ntuliaka a dị mmadụ 3598. Ihe PDP jiri gaa APC na ntuliaka a bụ 353.
Nke a mere na agaghị ekwunwu na onwere onye meriri ntuliaka a.
Ya mere, a ga-emegharị ntuliaka na 'ward' abụọ dị n'okpuru ọchịchị abụọ n'Ọshụn steeti.
Ugbua, ọ pụtara na-amabeghị ụbọchị a ga-emegharị ya bụ ntuliaka.

Nchịkọta vootu ole PDP nwetara bụ 254,698, ebe APC nwetara 254, 345; SDP nwetara 128,049.
BBC gbara Minista na-ahu maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed ajụjụ ọnụ maka etu ntuliaka siri pụta.
Maazi Mohammed si na obi adịghị amapụ pati ya, ma kwukwa na etu a osi kwụru gosiri ndị otu ha na Oshun na PDP abụghị pati eji egwu egwu.
Mana, okweghi ịgwa BBC etu ha si akwado maka mmegharị ntuliaka a, makana ọ sị na ọ ga-abụ ịgbara PDP ama.









