'Arụrụ m ọrụ nkuzi afọ 17 na-amaghị agụ maọbụ dee'

Ebe foto si, Alamy
"Ọ bụ ihe mgbaka ahụ ịnụ akụkọ na onyenkuzi amaghị agụ akwụkwọ. Ụfọdụ ndị mmadụ sị na ọ gaghị emenwu, na ọ bụ akụkọ ekonukọrọ ekonukọ, na omeghị eme.
Dịka nwata dị afọ isii, asaa, asatọ, aghọtaghị ihe bụ nsogbu m.
Mana achọrọ m ka ndị mmadụ mata na olileanya dị.
Anyị ndị na-amaghị agụ abụghị 'iti'. Anyị nwere ike ịmụta ka e si agụ. Oge ka dị.
Ọ bụ ihe mwute na anyị ka na-akwa ụmụaaka na ndị na-eto eto n'ụlọ akwụkwọ na-akụzirighị ha ọgụgụ na odide.
Oge m bụ nwata, nne na nna m gwara m na abụ m onye mmeri. N'afọ isii mbụ nke ndụ m, ekwenyere m n'ihe ha gwara m.
Ikwu okwu rara m ahụ mana eji ezi olileanya na m ga-esi n'aka ụmụnne m nwaanyị mụta ịgụ akwụkwọ were bido gawa akwụkwọ.
Na mbido, ihe niile na-aga nke ọma n'ihi na onweghị ọtụtụ ihe a chọrọ n'aka anyị karịa ịkwụ n'ahịrị, itukwu ala na ịga ebe a na-asa ahụ n'oge.
Oge o ruru Praimarị 2, ebe anyị kwesịrị ịmụta ka e si agụ, ọ dị m ka ịgụ akwụkwọ akụkọ ndị China n'ihi na aghọtaghị m ihe e dere."

E chetara m ikpe ekpere n'abalị sị, "Biko Onyenweanyị, mee ka m mara ka e si agụ akwụkwọ ma m teta echi".
Ụfọdụ ana m agbanye ọkụ, were akwụkwọ, lee ya anya iji mata ma aga m enweta ọrụ ebube mana enwetaghị m.
N'ụlọ akwụkwọ adanyere m n'oche ndị 'amaghị akwụkwọ'. A maghị ka m si banye n'etiti ndị ịgụ akwụkwọ na-ara ahụ, amakwaghị etu m ga-esi pụta, ebe m amaghị kwa ajụjụ m kwesiri ịjụ.

Onyenkuzi akpọghị ya oche ndị iti -onweghị obi ọjọọ ọbụla- mana ụmụaka na-akpọ ya oche 'ndị iti,' oge inọrọ n'oche ndị iti, i bido chewe na ị bụ iti.
Na nzukọ ndị nkuzi, onyenkuzi m gwara ndị mụrụ m,"Ọ bụ nwata dị gara gara. ọ ga-amụta ya," ha bugoo m na Praimarị 3.
"Ọ bụ nwata dị gara gara. ọ ga-amụta ya," ha bugoo m na Praịmarị 4...wdg.
Oge m ruru Praịmarị 5, ewerela m na m agaghị enwe ike igụnwu ihe.

M bilite kwa ụbọchị, akwado m, gawa akwụkwọ. Ọ dịka ịga agha mana anaghị enweta ya. A na m akwado gaa akwụkwọ mana akpọrọ m ụlọakwụkwọ asị.
Ana m edenwu aha m na mkpụrụokwụ ole na ole, mana anaghị m edenwu ahịrịokwu. O nweghị onye m gwara na m amaghị agụ. Ana m eme ọfụma n'egwuregwu na mgbakọ na mwepụ.
Mana oge m bara kọleji, egwu dagharịrị.
N'oge ule, ana m ele anya n'akwụkwọ ndị ọzọ maọbụ nye ndị ọzọ akwụkwọ ka ha deere m.
O nwere ụle, m kpọọrọ ndị otu anyị gaa ụlọọrụ onye ọkamụta anyị, buru igbe ya gaa gbakaa ya ma were akwụkwọ ule anyị.
Ebumnuche m niile bụ inweta asambodo.
Ka m gụchara Kọleji, e nwee mkpa ndị nkụzi, e were nyem ọrụ.
Agụru m Praịmarị na Sekọndrị na-enweghị onye chọpụtara na mụ amaghị agụ. Ọrụ nkuzi bụ ezigbo ebe izo n'ihi na o nweghị onye ga-atụ uche na onyenkuzi amaghị agụ.
Akụziri m ọtụtụ ihe; egwuregwu, Soshal Stọdịs, na ibi ihe (typing). Enwere m ike ibi okwu 65 n'otu nkeji mana amaghị ihe m na-ebi.
Anaghị m ede ihe n'ụgbọ ojii (blackboard). Anyị na-ekiri ọtụtụ ihe nkiri ma na-enwekwa mkpatrịtaụka.
Anaghị m akpọnwu aha. Ana ma agwa ụmụakwụkwọ ka ha kpọọ aha ha ka m nụ ya. E nwere ụmụakwụkwọ ndị matarala na ha ma agụ ma na-ede ndị na-enyere m aka. ị ga-enyo onyenkụzị gị enyo?
Akuziri m nkuzi n'ụlọakwụkwọ Sekọndịrị site n'afọ 1961 rue 1978 na-amaghị ihe agụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Agwara m nwunye m bụ Cathy, oge anyị na-akwado ịlụ mana ike kwe n'ihi na ihunanya na-egbu ya ka mmanya, ọ ghọtaghị ihe m kwuru. O chere na m kwuru na ịgụ oke akwụkwọ anaghị amasị m.
Ọ bụ ka nwa anyị nwaanyị ruru afọ atọ, ka ọ chọpụtara oge m na-agụrụ ya akụkọ ma akwụkwọ ọ hụrụ a zụrụ ya nke m amaghị akụkọ dị n'ime ya.
Afọ asatọ mjiri kwụsị ọrụ nkụzi, ka akụkọ m gbanwere.
Adị m afọ ịrị anọ na asaa na-aga afọ iri anọ na asatọ oge m m kiriri Barbara Bush, onye bụ nwunye onyeisiala nke abụọ -ebe ọ na ekwu maka ịgụ akwụkwọ okenye n'ihe onyonyo.
Nke ahụ bụ mbụ m na-anụ ka mmadụ na-ekwụ maka ịgụ akwụkwọ okenye. Echeburu m na ọ bụ sọsọ m nwere nsogbụ ahụ.
Ọ bụ ka m gara ịzụ ihe n'ọdọahịa ka m nụrụ ka ụmụnwaanyị abụọ na-akpa maka nwanne ha nwoke bụrụla okenye na-aga ọbaakwụkwọwo ịgụ akwụkwọ. Ọṅụ juru ha obi na ọ na-amụta ka esi agụ ihe.
M wee gaa ọba akwụkwọ ahụ kọwaara onyeisi ha. Etu ahụ ka m siri bido imụ ma mụta ịgụ akwụkwọ.









