Iron Biby: Nwoke sikasịrị ike n'uwa

Ebe foto si, Cheick Ahmed al-Hassan Sanou
Cheick Ahmed al-Hassan Sanou bụ onye buru oke ibu. Ọmaghị ka ike ya dị tupu ọ mafuo otu n'ime ndị na-achọ ya okwu.
Nke bụ akụkọ otu nwata a na-emekpa ahụ siri bụrụ onye nwere ike ị bụ onye kachasị ike n'uwa nille.
A mụrụ Sanou n' ala Burkina Faso na afọ 1992.
Mgbe oruru afọ ise, ọ hụrụ na nsogbu dị na ibu ya.
"Nne m kwuru na eburu m ibu mgbe a mụru m. M na-eji ike eku ume."
'Ahụ m esighị ike'

Ebe foto si, Cheick Ahmed al-Hassan Sanou
Cheick bụ onye nsụnsụ egwuregwu n'ulo akwụkwọ sports.
Ọ gwara BBC, "Abụ onye ọsọ ike - e nwere m ike ọsọ n'agbanyeghị na eburu m oke ibu."
Onye mmekpa ahụ ahapụla m aka
Mgbe o ruru afọ itoolu, mmekpa ahụ a na-emekpa ya aba ya n'ahụ.

Ebe foto si, Cheick Ahmed al-Hassan Sanou
"Ncheta ihe a, iwe ana-ewe m. Abụ m onye bukarịsịrị obere nwa, mana ihu m dị ka onye ji afọ anọ ka ha niile tukwasi nwa tọọrọ m n' ezinaulọ m." Iron Biby: Nwoke sikasịrị ike n'uwa
"Ndị mmadụ anaghị ebukarị oke ibu na Burkina Faso. Ụmụnwanyị ndị ibe m chọrọ ụmụnwoke ebughị oke ibu."
Ọ banyere otu egwuregwu ibu igwe

Ebe foto si, Cheick Ahmed al-Hassan Sanou
Na afọ 2009, ka Cheick dị afọ iri na asa, e zigara ya ala Canada ịgụ akwụkwọ sekọdrị.
Mgbe o ruru, Cheick nwere mkpebi ịtalata ahụ. O bidoro ị ga ụlọ- egwuregwu ndị chọrọ ahụ kpọrọ akpọ a na-akpọ gym na Bekee. Otu ihe mere ụtọ mere na ndu ya n'ihu.
Biko,leenụ Iron Biby

Ebe foto si, Cheick Ahmed al-Hassan Sanou
N'oge na adighi anya, Cheick abụrụla onye ama ama n'egwuregwu ndi na-ebu igwe.
Na afọ 2013, ọ meriri n' asọmpị ibu igwe, merikwa n'a asọmpị ibu igwe nke ala Canada na afọ nke ahụ.
Mgbe a ka a mụrụ onye ike Iron Biby.









