'A na m ahapụ akwụkwọ iji chute ezigbo mmiri'

Ebe foto si, AFP
Mario Macilau dị afọ iri abụọ na atọ (23) oge o gbanwere ekwenti nne ya iji gote ose foto Nikon. Ise foto abughịrị ihe ọhụrụ maka na o bidoro oge ọdị afọ iri na anọ sewe foto gbasara ndụ ndi obodo ha bụ Maputo dị n'isi obodo Mozambique.
O sela ọtụtụ ihe ndị ọọ bido n'ụmụaka nọ n'okporo ụzọ nakwa ndị ọrụ simenti na mba ahụ. Ugbu a, o burula ose foto ya che ebe okwu mmiri dị.
Foto ndị a e sere na ngwụcha afọ 2017 sitere na-enyemaka ndị otu a na-akpọ WaterAid maka ọrụ ozi ha na-arụ rue ngwụcha ọnwa a bụ Jenuwarị. Bido ugbu a rue afọ atọ na-abịa, Macilau ga-edekọ mgbanwe mere n'obodo ndị dị n'akụkụ Cuamba dị na Mozambique dịka ha nwetara ezigbo mmiri nakwa ebe mkposi.

Ebe foto si, AFP

Ebe foto si, AFP

Ebe foto si, AFP
Josefina na Eudicia, ha abụọ dị afọ iri na abụọ, ọ na-ahapụ akwụkwọ ihe ruru ugbo anọ n'izu iji chuo mmiri.
Ha na-eji ụkwụ aga Rio Naranja, iyi na-asọpụta n'osimiri Muassi, nke bụ isi ebe obodo Muassi na-enweta mmiri.
Iyi ahụ ahụ anaghị asọpụ asọpụ, nke a kpatara na mmiri ha na-echute na-acha ka mmiri ara dịka Macilau siri kwuo
WaterAid kwuru na otu nime nwatakịrị nọ n'ụwa enweghi ezigbo mmiri n'akụkọ ụlọ ha ebe ha enweghikwa ezi ebe mkposi.
kwa ụbọchị, ihe ruru ụmụaka narị asatọ na-erughi afọ ise na-anwụ site n'ọya afọ ọsịsa nke ajọ mmiri na gburugburu na adịghị ọcha na-akpata.

Ebe foto si, WaterAid/Mario Macilau

Ebe foto si, WaterAid/Mario Maclaụ

Ebe foto si, WaterAid/Mario Macilau

Ebe foto si, WaterAid/Mario Macilau
N'oge mmiri ozuzo, mmiri Lurio na-adị njọ nke ukwu n'ihi na atịtị ndị dị na gburgburu ebe mmiri ahụ dị ga-asanye na ya kpatara na-agahị anụ ya anụ.
N'obodo M'mele, mmiri ozuzo kwaturu otu ụlọ aja ụpa afọ atọ gara aga.
Onye isi ndị obodo ahụ kwuru na ndị mmadụ na-akwapụ n'obodo ahụ maka nsogbu mmiri ahụ.

Ebe foto si, WaterAid/Mario Macilau

Ebe foto si, WaterAid/Mario Macilau

Ebe foto si, WaterAid/Mario Macilau









