Buhari: Ị lee anya n'ọnọdụ dị oge m bịara, agbalikwaranụ m

Ebe foto si, @bashirahmad
Dịka ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Femi Adesina si kọwa: "Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwuola na e lee anya n'ọnọdụ ọchịchị ya kwudoro n'ala anyị, na enweghị ego e dowere, e mefuchara akụnaụba anyị, ọ gbaliịkwaranụ."
Adesina sị na Buhari kwuru nke a na Londọn oge ọ nabatara otu ndị nkwado ya nọ na mba ofesi nke a kpọrọ,"Buhari Diaspora Support Organization' na bekee nke onye ndu ha bụ Charles Efe Sylvester.
Buhari kwụrụ n'ọbụ ndị ajọ mmadụ kwariri akụ ala Najiria ma mee ka ndị obodo anyị daa ogbenye.
Mana okwu a Buhari kwuru kpara ọtụtụ ndị Naijiria iwe nke ha gosiri na sochal midia:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Onyeisiala na-ekwu na ya gbalịrị, mana mmadụ a na-elele onwe ya ule?
O mezuru nkwa ya na otu pati ya bụ APC kwere ndị Naijiria nke ha gbadoro ukwu were tunyere ya votu n'afọ 2015?
Kedụ ihe o merela ha n'ime nkwa ndị o kwere?
BBC Igbo lenyere anya n'asaa n'ime nkwa o kwere iji tulee ndị o mere na ndị o meghị:
I. Ibuso mmerụaka agha
Ihe o mere: EFCC napụtara ọtụtụ mmadụ e boro ebubo mmerụaka nnukwu ego na ụlọ mana o nwebeghị onye ụlọikpe mara ikpe maka mmerụka.

Ebe foto si, @bashirahmad
N'aka nke ọzọ, ndị pati ndị ọzọ na-ebo Buhari ebubo na ọ bụ sọsọ ndị esonyeghị na pati ya ka a na-anwụchi maka mmerụaka.
2. Ibuso Boko Haram agha iji nwe ezi nchekwa
O belatara mkpamkpa Boko Haram ma nata ha obodo ndị ha kpaara dịka nke ha.
N'aka nke ọzọ, nchekwa obodo ka na akpụ afọ n'ala n'ihi na ndị Fulani na-achị ehi egbuola ọtụtụ mmadụ n'ọgbaghara dị na-etiti ha na ndị ọrụugbo.
3. Inye ọrụ dị 720,00 kwa afọ
Ihe o mere: Kama inye ọrụ dịka Buhari siri kwe na nkwa ma rotekwara ndị mmadụ oge ọ biara na Legos nsonso, a chụrụ mmadụ ruru nde anọ n'ọrụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
4. Imachi ndị ọrụ gọọmenti ịga mba ofesi maka ọgwụgwọ ọrịa
Ihe o mere: Buhari amachighị ya dịka osi kwe na-nkwa, kama, ya onwe, na nwa ya nwoke bụ Yusuf gara mba ofesi maka ịnata ọgwụgwụ.
5. Otu nri n'ụbọchị maka ụmụaka Prịmarị nke gọọmentị
Ihe o mere: E bidola atụmatụ a na nanị steeti iri na anọ: Anambara, Enugwu, Oyo, Osun, Ogun, Ebonyi, Zamfara, Delta, Abia, Benue, Plateau, Bauchi, Kadụna na Taraba.
Mana ụfọdụ ndị ọrụ obodo kwụụru onwe ha sị na N70.00 maka otu nrị anaghị enye nri nwere isi.
6. Ịrụ mahadum nka nna ụzụ isii
Ihe o mere: A rụbeghị ọbụladi otu.
7. Ime ọkụ latrik ka ọ gbalite rue 20,000 megawat n'afọ anọ
Nke a bụ maka iji mee ka ọkụ na-adị mgbe niile.
Ihe o mere: Dịka Mịnịsta na-ahụ maka ọkụ bụ Babatiunde Fashola siri kwuo,Naijiria enwetarula 7000 megawat.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: