Nwaanyị a gbara di ya ọkụ makana ọ na emegbu ya

Kiranjit Ahluwalia

Ebe foto si, MARTIN EBERLEN

Otu mgbede, otu nwoke aha ya bụ Deepak Ahluwalia ji igwe eji ede akwa ọkụ hie nwunnye ya bụ Kiranjit n'ihu nke nyere ya apa.

Nwaanyị a nwetere ezogbote ụhụ maka ihe a di ya mere ya nke naghara ya ụra.

Omeela afọ iri atọ ihe a mere, ọ gwara BBC na ọ bụ ihe mere ya jiri kpawa nkata etu ya ga-eji memina di ya ka ọtakwanụ ụdịrị ahụhụ ya na-ata.

N'ime ofu abalị ahụ di ya tere ya igwe akwa ahụ, ọ wụru ya mmanụ ọkụ n'aba ka ọ na ararụ ụra wee mụnye ya ọkụ.

Ka o mechara nke a, o kuru nwa ya gbapụ ọsọ.

"Eche m na ọ bụ sọ ụkwụ ya ga-agba ọkụ ka ọgharị ịchụ m. A ga m enye ya apa nke ga-eme mgbe ọ bụla ọ hụrụ m, o chete m."

Ọ si na ya atala ezigbo ahụhụ na mmegbu n'aka di ya ruo afọ iri.

Ọ sị na o bidoro n'ụbọchị ọ lụrụ ya.

Kiranjit siri ọnwụ na ya achọghị igbu di ya.

Kiranjit Ahluwalia (Onye nke abuo site n'aka ekpe) mgbe atọghapụrụ ya

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Kiranjit Ahluwalia (Onye nke abuo site n'aka ekpe) mgbe atọghapụrụ ya

Mana ka ubọchị iri gachara, ọnya dị Deepak n'ahụ gburu ya.

A tụrụ Kiranjit nga n'ọnwa Decemba nke afọ ahụ. Mkpebi ụlọ ikpe bụ na ọ ga-anọ na nkpọrọ nwụọ maka ọnwụ di ya.

Mana ka otu ngalaba na-ahụ maka ikike dịrị onye bidoro mebe mkpọtụ maka okwu ya, ekpegharịrị ya, nke mere eji nye ha afọ atọ na ọnwa anọ n'ụlọ mkpọrọ.

Oge bụ oge ọ nọ na mkpọrọ mgbe ahụ, nke mere eji hapụ ha ka ọlaba.

Aha onyonyo, Kedụ ka Igbo si ahụta ụmụnwaanyị?