Anaghị ere nwaanyị ere
Ọbụghị ihe na-agbagwoju anya na ihe ọbụla Chimamanda Ngozi Adichie kwuru bụ ihe ndị mmadụ, n'ụwa niile, na-enyocha enyocha.
Nke a mere ka ihe o kwuru okwu banyere ịkwụ ụgwọ n'isi nwaanyị - bụ omenala ndị Igbo ka na-eme ugbua - soshal midia Naịjirịa nwụrụ ọkụ.
BBC Igbo gbara mbọ ka anyi nụta n'ọnụ onye ji ya bụ okwu na mkparịta ụka ya na ndị ntaakụkọ mere banyere atụmatụ o wepụtara eji akụziri ndị odee akwụkwọ akpọrọ "Farafina Creative Writing Workshop" na Bekee nke emere na Ikoyi ụbọchị 24 nke ọnwa Septemba bụ Monday.
Chimamanda gwara BBC na ọ bụ nghọtaghị ka ndị mmadụ mere okwu o kwuru, wee gaa n'ihu kọwa na ihe ya na-ekwu bụ na-ekwesiri itinye anya n'ihe banyere ịkwụ ụgwọ isi nwaanyị makana ụfọdụ na-emezi ya ka a na-ere, maọbụ ịzụta, nwaanyị ka ọ bụ.
Gee ya ntị n'elu.
Ndị mere akụkọ a: Chioma Nkemdilim Daramola na Nnamdi Agbanelo.