Nne m ochie bụ feminisiti - Chimamanda Adichie
Chimamanda Adichie bụ nwaada Igbo a ma ama na mbaụwa dịka onye na-ekwupu okwu maka ụmụnwaanyị ekwuola na ọtụtụ ụmụnwaanyị Igbo bụ feminisiti.
O kwuru na ọtụtụ ụmụnwaanyị Igbo bụ feminisiti ma na ha amaghị ihe ọ pụtara.
Chimamanda kọwara na 'feminizim' bụ oge nwaanyị na-agba mbọ onwe ya maọbụ pụta kwuo na ya na nwọke ha.