#EndFGM: 'Ọ fọrọ obere ka ibi ugwu gbuo nwa nwa m'

Ụmụaka ụmụnwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Ibi nwaanyị ugwu bụ otu emume ọjọọ ụfọdụ mba dị n'ime Afrịka ka na-eme rue ugbua.

Ya mere na n'ọnụọgụgụ nke ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka bụ Unicef n'aha ịchafụ jiri gosi na e biela ụmụnwaanyị ruru nde narị abụọ na mba iri atọ ugwu.

Nchọpụta ahụ gosikwara na a na-ebi ọtụtụ nwaanyị ugwu tupu ha eruo otu afọ.

FGM map

Otu onye na-azọ oke ruoro nwaanyị bụ Mary Odumeke tinyere ọnụ n'okwu a.

Ọ kọwara na ibi ugwu a bụ ihe emere nwunye nwa ya nwoke bụ nke mere ka nwaanyị na nwa ya chọ ịnwụ mgbe ọ gara ụlọọgwụ ịmụ nwa.

Ọ gwakwara BBC Igbo na ụfọdụ obodo ekwetaala igbochie omume ahụ mana ha jụrụ ịkwụsị mmemme so ya.

Ihe ọzọ o kwuru bụ na omenala Igbo na amaghị ama bụ ihe ndị na-akwalite emume a n'ala Igbo

Ihe ndị mmadụ ji ebi nwaanyị ugwu

  • Omenala Igbo chere na ibi nwaanyị ugwu ga-eme ka ọ ghara ịgba n'ilo.
  • Ọ gwara BBC Igbo na amaghị ama so n'ihe na-akwalite ihe a n'etiti ndị mmadụ
  • Ọzọ bụ na ụfọdụ ụmụ nwaanyị kwenyere na ọ bụrụ na nwaanyị ebeghi ugwu na ọ gaghị amụ nwa.
  • Ndị na-ebi ugwu ahụ kwuru na ha ahụghị ụzọ ọzọ ha ga-eji kpa nri ma ha kwụsị ibi ya bụ ugwu.
Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị